Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ọrụ Ndị Ozi 2:42-46

Ọrụ Ndị Ozi 2:42-46 BIU

Ha nyefere onwe ha nʼozizi nke ndị ozi, ya na ife ofufe na ịnyawa achịcha nakwa ikpe ekpere. Onye ọbụla nʼime ha jupụtara na egwu, nʼihi na ndị ozi na-arụ ọtụtụ ọrụ ebube, na ihe ịrịbama dị iche iche. Ndị niile kwere ekwe nọkọtara ọnụ, nwekọkwaa ihe niile ọnụ. Ha rere ihe ha nwere na nke ha kpatara, kenye onye ọbụla dịka mkpa ya siri dị. Ha gara nʼihu na-ezukọta nʼụlọnsọ ukwu ikpe ekpere kwa ụbọchị. Ha na-erikọkwa nri nʼụlọ ha, nʼobi ọṅụ na ekele.