Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ a fọdụrụ ka m ga-ewebata nʼime ọkụ.
Aga m eji ọkụ nụchaa ha dịka e si anụcha ọlaọcha,
jiri ọkụ nwaa ha dịka e si anwa ọlaedo.
Ha ga-akpọku aha m,
aga m azakwa ha.
Aga m asịkwa, ‘Ndị a bụ ndị m,’
Ha onwe ha ga-asịkwa, ‘ONYENWE ANYị bụ Chineke anyị.’ ”