Ị sịrị, ‘Ahụhụ dịịrị m! Lee na ONYENWE ANYị atụkwasịrịla m mwute nʼelu ihe mgbu nke m nwere. Ike ịsụ ude agwụla m, ma ruo ugbu a, achọtabeghị m izuike.’ Ma ihe ndị a ka ị ga-agwa ya, ‘Otu a ka ONYENWE ANYị kwuru, Aga m akwada ihe ndị ahụ niile m wuru, hopukwa ihe ndị ahụ niile m kụrụ nʼala a niile.