A sịkwarị na osisi fiig amaghị ifuru,
na ọ dịghị mkpụrụ dị nʼosisi vaịnị,
a sịkwa na mkpụrụ osisi oliv ebilata
na ala ubi niile emepụtaghị ihe oriri,
a sịkwa na ọ dịghị atụrụ dị nʼọgba anụ,
na ọ dịkwaghị ehi nọ nʼụlọ anụmanụ,
mụ onwe m ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ nʼime ONYENWE ANYị.
Aga m etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke Onye nzọpụta m.