1
Ọrụ Ndị Ozi 19:6
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
BIU
Mgbe Pọl bikwasịrị ha aka ya abụọ nʼisi, ha natara Mmụọ Nsọ. Ha kwukwara okwu nʼasụsụ dị iche iche, bukwaa amụma.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Ọrụ Ndị Ozi 19:6
2
Ọrụ Ndị Ozi 19:11-12
Chineke sitere nʼaka Pọl rụọ ọtụtụ ọrụ ebube pụrụ iche. Nke bụ na-ewere ụfọdụ nʼime akịsị maọbụ ịchafọ na akwa mgbochi nke metụrụ ya nʼahụ na-atụkwasị nʼahụ ndị ọrịa, ahụ a dịkwa ha ike. E sitekwara na ya chụpụ mmụọ ọjọọ.
Nyochaa Ọrụ Ndị Ozi 19:11-12
3
Ọrụ Ndị Ozi 19:15
Mmụọ ọjọọ ahụ zara ha sị, “Amaara m onye Jisọs bụ, amakwaara m onye Pọl bụ, ma unu onwe unu, unu bụ ndị ole?”
Nyochaa Ọrụ Ndị Ozi 19:15