Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara NDI ROM 8:39

E Nyefewo M Chineke Ihe Niile: Ihe Òfùfè Gasị N'eme Mkpali Ndị Nọ Na Mkpọrọ Derè
Ụbọchị Anọ
Akwụkwọ Nsọ bụ̀ akwụkwọ nke mgbapụta, nnwere onwe, na olileanya. N'ime ibe Ya gasị, enwerè ọtụtụ ndị dị iche iche ná akparamá-àgwà ha na obibi ndụ ha ma wee jupụta n'ike— ndị ikom na ndị inyom ndụ tijisìrì ná-achọ́ azịza banyere ngabiga ha na ahụmahụ ha n'ụwa. Ị lee anya, ha dị nnọọ ka ndị nọ na mkpọrọ ugbu a na ndị si na mkpọrọ pụta bụ́ ndị dere ihe òfùfè ndị a i gajè ịgụ. Ọ bụ olileanya anyị na ịga enweta agbamume ma nwee mkpali dị ike na mma site n'olu gasị ndị ụka nọ na mkpọrọ. Ka akaebe ha na nkwupụta ha mee ka anyị niile nwere onwe anyị.

Chineke Bụ̀ _______
Ụbọchị Isii
Ònyé ka Chineke bụ̀? Anyị niile nwerè azịza dị iche iche, mana olee otu anyị gà-esi mara nke bụ eziokwu? N'agbanyeghị ụdị ahụmahụ inwerè ebe Chineke nọ, gị na Ndị Kraịst, ma ọ bụ gị na ndị ụka, oge erụwọ iji chọpụta Chineke maka Onye Ọ bụ n'ezie—Chi dị irè, dị adị, na dị njikere izụte gị kpọmkwem ebe ị nọ. Zọpụ ụkwụ nke mbụ n'ime Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a dị ụbọchị isii n'eso usoro ozizi Ụkọ Chukwu Craig Groeschel, Chineke Bụ̀ _______.

Igodo Asaa Iji Nweta Mmetụta Uche Zuru Okè
Ụbọchi Asaa
Enwere ma ọ dịkarịa-ala akụkụ asaa bụ isi nke izu-oke n'ịchọ ihe nke Chineke kacha mma maka ọdị nma ndụ mmetụta uche gị. Ọ dịghị mkpa ka iwere ha n'usoro n'usoro. Soro Dr. Charles Stanley ka ọ nà-enyere gị aka iwulite àgwà ndị bụ isi n'ime ndụ gị nke ga-enyere gị aka itozù-oke na mmụọ na mmetụta-uche gị. Chọpụta atụmatụ ihe ọgụgụ dị ka nke a na intouch.org/plans.

Ǹkà nke Imeri
Ụbọchi Asaa
Ndụ juputara na ndọghachi azụ, mfụ̀, ndakpọ olileanya, na ihe mgbu. “Nkà Nke Imeri” ga-enyere gị aka idị̀ mfụ̀, iru újú, na ihe mgbu ọbụla bịakwutere gị. Ọ bụ maka ịjụ ikwe ka ihe ndị dị ka njedebe mee ka ị daa mbà ma ọ bụ mebie ọganihu gị. Kama, kwe ka Chineke mee ka ha niile bụrụ mmalite-ọhụrụ gasị. Mgbe ndụ dị mgbagwoju-anya ma sie ike, adala mbà. Welie anya gị elu. N'agbanyeghị oge siri ike ma ọ bụ mfụ̀ na-egbu mgbu ị na-eche ihu, Chineke nọnyeere gị.