Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara NDI ROM 8:28

Ibi Ndụ Gbanwere-Agbanwe: N'ime Afọ Ọhụrụ
Ụbọchị Anọ
Afọ ọhụrụ ọ bụla n'eji ohere maka mmalite ọhụrụ abịa. Ekwela ka nke a bụrụ afọ ọzọ na-amalite site na mkpebi ndị ịma na ị gaghị edebe. Atụmatụ ihe ọgụgụ nke ụbọchị anọ a ga-eduzi gị na ntụgharị-uche ma nye gị echiche ọhụrụ ka ị wee nwee ike ime ka afọ a bụrụ nke kachasị mma nye gị ma n'aga n'ihu.

Ikweré Na Chineke Dị Mma N'agbanyeghị Ihe Ọbụla
Ụbọchị Ise
E nwerè ụfọdụ ozizì taa, mà n'èzí ma n'ime ụka, ndị metọrọ ezi ozi nke ihu ọma Chineke. Nke bụ́ eziokwu bụ na iwu ejighị Chineke inye anyị ihe ndị dị mma — mana Ọ chọrọ imere anyị otú ahụ! Ụbọchị ise na abịanụ gà-enyere gị aka ka iji anya sara asa lee anya ọzọ gburugburu gị n'ụzọ dị ọhụrụ, ka ị wee hụ ịdị nma Chineke dị oké ukwuu na nke ana apụghị igonarí.

Ibi Ndụ Gbanwere Agbanwe: Nzube
Ụbọchị Ise
Ò nwetụlá mgbe ị cherè ihe Chineke kerè gị ka imee n'ụwa ma ọ bụ i jụtụlá Ya ihe mere ijirì gabiga ụfọdụ ahụmahụ? E kerè gị ọpụrụiche maka ụdị ọrụ naanị gị pụrụ ịrụ. Ọ bụrụgodị na ọ dị gị ka ị furù éfù, ma ọ bụ ị maghị ka ịgà esi gaa ihu, atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị ise gà-enyere gị aka ịtụkwasị Chineke obi, ka O wee nwee ike iduga gị ná nzube gị.

Ǹkà nke Imeri
Ụbọchi Asaa
Ndụ juputara na ndọghachi azụ, mfụ̀, ndakpọ olileanya, na ihe mgbu. “Nkà Nke Imeri” ga-enyere gị aka idị̀ mfụ̀, iru újú, na ihe mgbu ọbụla bịakwutere gị. Ọ bụ maka ịjụ ikwe ka ihe ndị dị ka njedebe mee ka ị daa mbà ma ọ bụ mebie ọganihu gị. Kama, kwe ka Chineke mee ka ha niile bụrụ mmalite-ọhụrụ gasị. Mgbe ndụ dị mgbagwoju-anya ma sie ike, adala mbà. Welie anya gị elu. N'agbanyeghị oge siri ike ma ọ bụ mfụ̀ na-egbu mgbu ị na-eche ihu, Chineke nọnyeere gị.

Bie Ndụ n’Ike n’Obi Ike!
8 Ụbọchị
Ị nọghị naanị gị. Ma ị dị ụbọchị 1 ma ọ bụ afọ 30 n'ime okwukwe Ndị Kraịst, eziokwu a na-eguzosi ike maka ihe niile ndụ nwere ike ịma anyị aka. Mụta ka ị ga-esi nabata enyemaka Chineke nke ọma na atụmatụ a. Ewepụtara site n'akwụkwọ a, “Site n’ụwa a; Akwụkwọ ntuziaka Ndị Kraịst maka Uto na Nzube” nke David J. Swandt dere.