Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara NDI ROM 8:16

Mmesi Obi Ike
Ụbọchị Anọ
Chineke chọrọ̀ ka ị mara na A ZỌPỤTAWO gị nakwà na ị gà-aga eluigwe! Mmesi obi gị ike na nke a gà-eto site na izutè Chineke na ịtụgharị uche na Okwu Ya. Amaokwu ndị a n'esote, e burú ha n'isi, pụrụ inyere gị aka ịdaberè jụụ na Chineke n'ụbọchị gị niile. Mee ka ndụ gị gbanwee site n'iburu Akwụkwọ Nsọ n'isi! Maka usoro zuru okè ịgà eji wee buru Okwu Chineke n'isi, gaa na MemLok.com

Afọ Ọhụrụ: Mmalite Ọhụrụ
Ụbọchị Ise
Afọ ọhụrụ pụtarà mbido ọhụrụ na mmalite n'adọkpụghị ihe ọbụla. Ọ bụ oge iji mee ntọgharị, mee mmegharị, na zọọ uche gị ọzọ na ihe kachasị mkpa na ndụ gị. Inwe afọ dị nma karịa ka inwetụrụlà na-amalite site na gị ịma na e mere gị ọhụrụ site na Jizọs. Bie ndụ n'ime mmegharị ọhụrụ a n'ime afọ ọhụrụ a!

Gị Bụ́ Onye A Họọrọ: N'echetara Onwe Gị Maka Oziọma Kwa Ụbọchị
Ụbọchị Asaa
Gịnị gà-eme ma ọ bụrụ na gị eteta-ụra kwa ụbọchị wee n'echetara onwe gị maka Oziọma? Ihe òfùfè a dị ụbọchị asaa chọrọ nnọọ inyere gị aka ime otù ahụ! Ọ bụghị naanị na Oziọma na-azọpụta anyị, Ọ na-akwadokwa anyị ruo ná njedebe nke ndụ anyị. Odee na Onye N'ekwusa Oziọma Matt Brown meberè atụmatụ ihe ọgụgụ a daberé na akwụkwọ ihe òfùfè dị ụbọchị iri atọ nke Matt Brown na Ryan Skoog derè.