Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara NDI ROM 12:2

Kulie, Jìrí Obi Ike Gaa Ihu Na Ndụ
Ụbọchị Atọ
Ọ bụrụ na olu gasị nke enweghị nchebe, obi abụọ, na egwù abụghị nke e cherè ihu, ha ga-achị ndụ gị. Ị nweghị ike imechi olu ha ma ọ bụ leghara ha anya. N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị atọ, Sarah Jakes Roberts na-egosi gị otu ị ga-esi kuchie ọnụ mgbochi gasị nke si na ndụ gị gara aga wee nabata ihe ndị ahụ dịka ha dị nsogbu ka ị wee bụrụ onye ihe ọbụla n'apụghị ịkwụsị.

Nwoke a gọziri agọzi
5 Ụbọchị
Agwa dị iche iche ejiri mara onye ihe na-agara nke ọma. Nnyefe Kpam kpam na-arụtu aka na mkpughe, agwa ndị ejiri mara onye ihe ná-agara nke ọma. Nkesa nke onye ihe na-agara nke ọma na onye na-emebi iwu. Etu onye ihe na - agara nke ọma si a diri ndụ ogologo.

Ibi Ndụ Mgbanwe: Ịnabata Ezi Onye A Bụ̀
Ụbọchị Isii
N'ihi na enwerè ọtụtụ olu na-agwa anyị onye anyị kwesịrị ị bụ́, ọ bụghị ihe ijuanya na anyị n'enwe mgba nke nkọwapụta ezi onye anyị bụ̀. Chineke achọghị ka ọrụ anyị, ọnọdụ alụmdi na nwunye anyị, ma ọ bụ mmejọ anyị kọwapụta ndị anyị bụ̀. Ọ chọrọ ka echiche Ya bụrụ ikike kachasị elu na ndụ anyị. Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị isii gà-enyere gị aka ka i tinye n'obi gị, isi gị na uche gị ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu gbasara onye ị bụ̀ na ka i nakwere onye i bụ̀ n'ezie n'ime Kraịst.

Gịnị Bụ Ezi Ịhụnanya?
Ụbọchị Iri Na Abụọ
Onye ọ bụla chọrọ ịma ihe ịhụnanya bụ̀ n'ezie. Ma ọ bụ̀ mmadụ ole na ole nà-ele ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara ịhụnanya anya. Ịhụnanya bụ otu n'ime isi okwu nke Akwụkwọ Nsọ na omume kacha mkpa nke ndụ Ndị Kraịst. Atụmatụ ihe ọgụgụ a siteré na Thistlebend Ministries nà-enyocha ihe ịhụnanya pụtarà na Akwụkwọ Nsọ na otù a gà-esi hụ Chineke na ndị ọzọ n'anya n'ụzọ ka nma.