Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara ABÙ ỌMA 147:3

Ibi Ndụ Gbanwere-Agbanwe: N'ime Afọ Ọhụrụ
Ụbọchị Anọ
Afọ ọhụrụ ọ bụla n'eji ohere maka mmalite ọhụrụ abịa. Ekwela ka nke a bụrụ afọ ọzọ na-amalite site na mkpebi ndị ịma na ị gaghị edebe. Atụmatụ ihe ọgụgụ nke ụbọchị anọ a ga-eduzi gị na ntụgharị-uche ma nye gị echiche ọhụrụ ka ị wee nwee ike ime ka afọ a bụrụ nke kachasị mma nye gị ma n'aga n'ihu.

Ibi Ndụ Mgbanwe: Ịnabata Ezi Onye A Bụ̀
Ụbọchị Isii
N'ihi na enwerè ọtụtụ olu na-agwa anyị onye anyị kwesịrị ị bụ́, ọ bụghị ihe ijuanya na anyị n'enwe mgba nke nkọwapụta ezi onye anyị bụ̀. Chineke achọghị ka ọrụ anyị, ọnọdụ alụmdi na nwunye anyị, ma ọ bụ mmejọ anyị kọwapụta ndị anyị bụ̀. Ọ chọrọ ka echiche Ya bụrụ ikike kachasị elu na ndụ anyị. Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị isii gà-enyere gị aka ka i tinye n'obi gị, isi gị na uche gị ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu gbasara onye ị bụ̀ na ka i nakwere onye i bụ̀ n'ezie n'ime Kraịst.