Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara NDI FILIPAI 1:6

Ndị Filipaị
Ụbọchị Ise
Ọ bụrụ na ị nọ ọdụ n'ụlọ mkpọrọ--ebe oké itirì gbara--ma ịnọ n'ime ebe dị otú ahụ n'ihi na e boro gị ebubo mpụ ị n'emeghị, gịnị ka ị ga-akọ na akwụkwọ ozi ịga e zitere ndị enyi gị? Akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị ụka Filipaị na-ekpughe mmadụ jupụtara n'ọṅụ--ọbụna na ọ nọ ọdụ n'ụlọ mkpọrọ ndị Rom. Akwụkwọ Filipaị bụ akwụkwọ nke ịdị nnukwu ike n'obi na inwe ọṅụ ọbụna mgbe a n'agabiga ọnwụnwa siri ike. Soro Kris Langham mee njem eduziri eduzi n'ime akwụkwọ Filipaị.

Bido Ebe A | Nzọụkwụ Mbụ Gasị Na Jizọs
Ụbọchị Iri na Ise
Ọ bụrụ na ị bụ onye ọhụrụ n'imata Jizọs, bụrụ onye ọhụrụ n'ịgụ Akwụkwọ Nsọ, ma ọ bụ na ị nà-enyere enyi gị aka bụ onye ọhụrụ n'ime ihe ndị a - Malite Ebe A. N’ime ụbọchị 15 na-abịa, ihe ngere ntụziaka ndị a nke ga-ewe minit 5 ige ha gà-eji nwayọọ nwayọọ duru gị gabiga Akwụkwọ Nsọ abụọ bụ́ isi: Mak na Ndị Kọlọsi. Soro akụkọ gbasara Jizọs ma chọpụta ihe ndabere nke iso Ya, yana ajụjụ kwa ụbọchị maka ntụgharị uche nke otu onye ma ọ bụ mkparịta ụka otù. Soro otu ugboro ka ị malite, kpọtakwa enyi gị ka o soro, gị esorokwa ọzọ!