Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara MATIU 6:16

Mee Ohere Maka Ihe Di Mkpa: Ihe Ise Ihe Ọmụme Ndi Nke Ime Mmụọ Maka Lenti
Ụbọchi Asaa
Lentị: oge ntụghari uche na nchegharị nke ụbọchị iri anọ. Ọ bụ echiche mara mma, mana gịnị ka ime Lentị dị kà n'ezie? N'ime ụbọchị asaa na-esote, chọpụta àgwà ime mmụọ ise ị nwerè ike ịmalitè ime n'oge Lentị iji nyere onwe gị aka ịkwado obi gị maka Sonde Mbilite N'ọnwụ—na ụbọchị ndị ọzọ n'esotekwe.

Ibu Ọnụ Ụbọchị Iri Abụọ Na Otu
Ụbọchị Iri Abụọ Na Otu
Malite afọ ọhụrụ gị n'ilekwasị anya na ọzụzụ ime mmụọ nke ibu ọnụ. Atụmatụ ihe ọgụgụ a gụnyere ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ gbasara ibu ọnụ na ndị ọzọ na-agba ume ime ntụgharị uche na ịbịaru Chineke nso. Site n'otu ụbọchị ruo nke iri abụọ na otu, ị ga n'enweta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ị ga n'agụ kwa ụbọchị, obere ihe ọgụgụ nke òfùfè, ajụjụ gasị na-akpali ntụgharị uche, na ekpere ga-echebe gị ihu n'ihe bara uru. Maka ọdịnaya ndị ọzọ, lelee www.finds.life.church.