Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara MATIU 2:1

Onyinye nke Ekeresimesi
Ụbọchị Anọ
Ekeresimesi bụ oge iji mee ememme nke onyinye kachasịnụ, Jizọs. Ile anya n'akụkọ nke atumanyá ọbịbịa Kraịst na Ekeresimesi na-echetara anyị na Jizọs bịara ịbụ mmezu nke nkwa Chineke na ikwesị ntụkwasị obi Ya. Olileanya anyị na ekpere anyị niile bụ nke a zara n'ihu Jizọs, Immanuel, Chineke nọnyeere anyị.

Iji Ịtụnanya Kpee Ekpere Site Na Mbido Ruo Ọgwụgwụ Ekeresimesi
Ụbọchị Asaa
Akụkọ Ekeresimesi jupụtara n'ihe ịtụnanya kwa ịtụnanya. Ma mgbe ụfọdụ nkọwa ya n'adị ka ihe ama ama nke n'eme ka mmetụta ya ghara ịdị ka ọ kwesịrị. Ihe ofufe ekpere ndị a dị́ obere na-enyere gị aka ịtụgharị uche n'ụzọ dị omimi n'ihe á n'atụghị anya ma baa oké uru mere, na akụkọ ihe mere eme nke mmadụ nọ n'ụwa a: na Chineke n'Onwe Ya bịara ghọọ otu n'ime anyị. David Mathis, onye isi nchịkọta akụkọ maka desiringGod.org na pastọ na Cities Church dị na Saint Paul, Minnesota dere ekpere ọ bụla.

EKERESIMESI: Mmezù Atụmatụ Chineke Maka Nnapụta
Ụbọchị Iri Na Anọ
Chi ụgha ihe a kpọrọ mmadụ chepụtara iji kọwaa chi ha maara na ọ ga-adịrịrị, dị nnọọ ka ụmụ mmadụ. Ha bụ chi ndị eji òfùfè na inye ihe rịọ ka ha legodi anyị anya. Mana Chi ahụ naanị Ya bụ Ezi Chi ebula ụzọ malite wee na-achọ anyị––ịnapụta anyị wee kpọghachi anyị azụ na Onwe-Ya. Nke ahụ bụ akụkọ Ekeresimesi.

Ịchọpụtagharị Ịma Mma Nke Oge Ekeresimesi
Ụbọchi Iri Abụọ Na Ise
Malite ihe omume Ekeresimesi dị ọhụrụ site n'ime ihe n'ụzọ n'abụghị otu esi emebu ya n'oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa. Ụbọchị mmalite dị́ mma maka ihe omume a bụ Disemba 1, ebe mmalite dị ọsọ karịa ụbọchị a n'enye ohere ime ya n'ụzọ n'adịghị enye nsogbu. Ihe omume a gụnyerè ajụjụ ntụgharị uche gasị na ihe ndị aga-eme n'usoro iji kwụwa kwa ụbọchị chịm na Kraịst. Ihe omume a marà ezigbo mma maka ndị mmadụ ime ya n'otu n'otu, ezinụlọ imekọta ya, ma ọ bụ obere otù gasị imekọta ya.