Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara MATIU 1:24

Nọgidenụ N'ime Jizọs - Ihe Òfùfè Nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Dị Ụbọchị Anọ
Ụbọchị Anọ
Ekeresimesi na-abịa! Soro ya n'abịa bụ Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa – ikwadebé maka na ime ememe nke ọmụmụ Jizọs. Mana eziokwu ahụ ọ̀ na-efunahú ka a n'eme nkwaghari n'oge ezumike, ịzụta onyinye ahụ zuru okè, ma ọ bụ ịchịkwa nnọkọ erimeri na anụmanụ gasị nke ezinụlọ? N'ọsọ ọsọ nke oge Ekeresimesi, nweta ụzọ ọhụrụ gasị iji soro Okwu Chineke na-akpakọrịta, gá adọtakwu gị nso na Ya n'ikpeazụ. Mee ka mkpụrụ obi gị teta site n'igụ atụmatụ ihe ọgụgụ nke ụbọchị anọ a sitere na Abide Bible Journals nke Thomas Nelson.

Akụkọ Ekeresimesi
Ụbọchị 5
Akụkọ ọma ọ bụla nwere mgbe ihe ana-atụghị anya n'eme na ya—oge ana-atụghị anya ya na-agbanwe ihe niile. Otu ụdị mgbanwe a kachasị dị ukwu n'ime Akwụkwọ Nsọ bụ Akụkọ Ekeresimesi. N'ime ụbọchị ise na-esote, anyị ga-enyocha otu ihe a merenụ si gbanwee ụwa yana otu ọ ga-esi gbanwee ndụ gị ụbọchị taa.

Ụbọchị Asaa Nke Akụkọ Ekeresimesi: Ihe Òfùfè Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa Maka Ezinụlọ
Ụbọchị Asaa
Ọ dị ka mmakụ mara mma, njikọ aghụghọ n'adịghị, na ime ememe ihe n'atọ obi ụtọ dị̀ anyị niile oké mkpa ugbu a. Ekpere anyị bụ na ihe òfùfè a nke Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa ga-enye gị na ezinụlọ gị ụzọ isi jikọọ, mụọ ihe banyere akụkọ nke Ekeresimesi bụ ezi ya, na mee ememe ọmụmụ Jizọs jírí ihe gasị ọhụrụ a n'eme eme, akụkọ gasị a n'akọ n'oge a n'eri nri abalị, mkparịta-ụka gasị n'oge a chọrọ ilakpú ụra, na ihe omume gasị nke ezinụlọ. Ọ bụ olileanya anyị na "mmakụ" nke Ekeresimesi a ga-ewetara gị na ezinụlọ gị ihe ncheta gasị mara mma oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa a!

Ịchọpụtagharị Ịma Mma Nke Oge Ekeresimesi
Ụbọchi Iri Abụọ Na Ise
Malite ihe omume Ekeresimesi dị ọhụrụ site n'ime ihe n'ụzọ n'abụghị otu esi emebu ya n'oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa. Ụbọchị mmalite dị́ mma maka ihe omume a bụ Disemba 1, ebe mmalite dị ọsọ karịa ụbọchị a n'enye ohere ime ya n'ụzọ n'adịghị enye nsogbu. Ihe omume a gụnyerè ajụjụ ntụgharị uche gasị na ihe ndị aga-eme n'usoro iji kwụwa kwa ụbọchị chịm na Kraịst. Ihe omume a marà ezigbo mma maka ndị mmadụ ime ya n'otu n'otu, ezinụlọ imekọta ya, ma ọ bụ obere otù gasị imekọta ya.