Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara MATIU 1:12

Isi n’Ụzọ Oziọma Lenye Anya n’Amara Chineke
3 Ụbọchị
Njem Ndị Kraịst bụ nke anyị na-adịghị ahụ Chineke ihu na ihu, anyị na Ya na-akpakọrịta ma na-ekwurịta okwu site n’okwukwe. Naanị ụzọ anyị ga-esi mee ihe na-atọ Chineke ụtọ mgbe anyị na ya na-aga ije bụ site n’ịga ije n’okwukwe, ebe anyị apụghị iji anya nkịtị hụ ya. Anyị na-anụ ya site n’okwukwe, anyị na-agwa ya okwu site n’okwukwe, anyị na-agakwurukwa ya n’ekpere site n’okwukwe.

Ibi Ndụ Gbanwere Agbanwe: Nà Ekeresimesi
Ụbọchị Ise
N'ime nkwagharí na nchigharí nile nke oge ezumike, ọ na-adị mfe ịchefù ihe mere anyị ji eme ememe. N’ime atụmatụ ihe ọgụgụ nke amụma-ọkwa-ọbịbịa a dị ụbọchị ise, anyị gà-amikpunye onwe anyị n’ime nkwa ndị e mezurù site na ọmụmụ Jizọs na olileanya anyị nwerè maka ọdịnihu. Ka anyị nà-amụtakwụ ihe gbasara onye Chineke bụ, anyị gà-achọpụta ka anyị gà-esi bie ndụ n’oge ezumike a site n’olileanya, okwukwe, ọṅụ, na udo.