Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara JENESIS 50:20

Ahụhụ
Ụbọchị Anọ
Ịta ahụhụ so bụrụ akụkụ bụ́ isi nke okwukwe Ndị Kraịst - 2 Timoti 3:12. Nzaghachi gị nye ịta ahụhụ dịka nwa Chineke na-eto site n'izute Chineke na ịtụgharị uche n'Okwu Ya. Amaokwu ndị na-esonụ, mgbe e burù ha n'isi, pụrụ ịgba gị ume ka ị meghachi omume nye ịta ahụhụ n'ụzọ kwekọrọ-ekwekọ dịka nwa Chineke.

Nyè Ọrụ Gị Uru Ziri Ezi
Ụbọchị Anọ
Ọtụtụ n'ime anyị ga-eji ihe gafere ọkara ndụ nke ntorobịa anyị n'arụ ọrụ. Anyị chọrọ ima na o nwerè ihe ọrụ anyị n'arụ pụtara — na ọrụ anyị n'arụ bara uru. Mana nrụgide, ihe gasị a chọrọ ka anyị mee, na ihe mgberede nwere ike ime ka anyị hụ ọrụ dịka ihe siri ike — ihe anyị n'agaghị eji obi anyị niile wee mee. Atụmatụ ihe ọgụgụ a gà-enyere gị aka imata ike i nwerè ịhọrọ uru ziri ezi maka ọrụ gị dị mgbọrọgwụ na okwukwe.

Ibi Ndụ Gbanwere-Agbanwe: N'ime Afọ Ọhụrụ
Ụbọchị Anọ
Afọ ọhụrụ ọ bụla n'eji ohere maka mmalite ọhụrụ abịa. Ekwela ka nke a bụrụ afọ ọzọ na-amalite site na mkpebi ndị ịma na ị gaghị edebe. Atụmatụ ihe ọgụgụ nke ụbọchị anọ a ga-eduzi gị na ntụgharị-uche ma nye gị echiche ọhụrụ ka ị wee nwee ike ime ka afọ a bụrụ nke kachasị mma nye gị ma n'aga n'ihu.

Ibi Ndụ Gbanwere Agbanwe: Nzube
Ụbọchị Ise
Ò nwetụlá mgbe ị cherè ihe Chineke kerè gị ka imee n'ụwa ma ọ bụ i jụtụlá Ya ihe mere ijirì gabiga ụfọdụ ahụmahụ? E kerè gị ọpụrụiche maka ụdị ọrụ naanị gị pụrụ ịrụ. Ọ bụrụgodị na ọ dị gị ka ị furù éfù, ma ọ bụ ị maghị ka ịgà esi gaa ihu, atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị ise gà-enyere gị aka ịtụkwasị Chineke obi, ka O wee nwee ike iduga gị ná nzube gị.

Ịgbagharà Ndị N'emerụ Anyị Ahụ
Ụbọchị asaa
Mà ànyị nà-agabiga mmerụ ahụ nke mmetụta-uche ma ọ bụ mmerụ ahụ nke anụ ahụ, mgbaghara bụ isi nkụme nke ebim ndụ Ndị Nke Kraịst. Jizọs Kraịst nwerè ahụmịhe nke mkpaso àgwà niile n'ezighị ezi na mmeso ọjọọ niile, ọbụnadi ruo n'ókè nke ọnwụ na-ezighị ezi. N'agbanyeghị nke a, na awa ikpeazụ Ya, Ọ gbaghaara onye ohi na-akwa Ya emo nọ n'obe nke ọzọ nakwa ndị gbụrụ Ya.