Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara NDI GALETIA 5:24

Udo Ahụ N'efunahụ Anyị
Ụbọchị asaa
Ọ̀ gà-ekwe omume n'ezie inwe udo mgbe ndụ jupụtarà na ihe mgbu? Azịza dị mkpirikpi bụ: ee, ma ọ bụghị n'ike nke anyị. N’ime otu afọ nke mere ka ọ dị anyị ka ibu arọ ọ dakwasịrị anyị niile, ọtụtụ n’ime anyị nwerè ajụjụ. N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ nke Akwụkwọ Nsọ a dị ụbọchị asaa, isorò usoro ozi Pastọ Craig Groeschel, anyị gà-ekpughe otù anyị gà-esi chọta Udo Ahụ N'efunahụrụ anyị nke anyị niile nà-achọsi ike.

Gịnị Bụ Ezi Ịhụnanya?
Ụbọchị Iri Na Abụọ
Onye ọ bụla chọrọ ịma ihe ịhụnanya bụ̀ n'ezie. Ma ọ bụ̀ mmadụ ole na ole nà-ele ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara ịhụnanya anya. Ịhụnanya bụ otu n'ime isi okwu nke Akwụkwọ Nsọ na omume kacha mkpa nke ndụ Ndị Kraịst. Atụmatụ ihe ọgụgụ a siteré na Thistlebend Ministries nà-enyocha ihe ịhụnanya pụtarà na Akwụkwọ Nsọ na otù a gà-esi hụ Chineke na ndị ọzọ n'anya n'ụzọ ka nma.