Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara EZIKIEL 47:8

Banye na Nzube
Ụbọchị Ise
Gịnị bụ̀ nzube m? Kedụ ihe m kwesịrị iji ndụ m mee? Gịnị bụ̀ atụmatụ Chineke maka m? Ihe ndị a niile bụ ajụjụ ọtụtụ n'ime anyị nà-ajụ n'otu oge ma ọ bụ ọzọ na ndụ anyị. Anyị bù n'obi ịza ụfọdụ ajụjụ ndị a kà anyị nà-atọ́ghasí ihe ịbanye ná nzube gị bụ̀. Soro ụmụ akwụkwọ ole na ole nke kọleji C3 ka ha n'ènyé ụfọdụ nkọwa n'isiokwu a.

Ibu Ọnụ Ụbọchị Iri Abụọ Na Otu
Ụbọchị Iri Abụọ Na Otu
Malite afọ ọhụrụ gị n'ilekwasị anya na ọzụzụ ime mmụọ nke ibu ọnụ. Atụmatụ ihe ọgụgụ a gụnyere ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ gbasara ibu ọnụ na ndị ọzọ na-agba ume ime ntụgharị uche na ịbịaru Chineke nso. Site n'otu ụbọchị ruo nke iri abụọ na otu, ị ga n'enweta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ị ga n'agụ kwa ụbọchị, obere ihe ọgụgụ nke òfùfè, ajụjụ gasị na-akpali ntụgharị uche, na ekpere ga-echebe gị ihu n'ihe bara uru. Maka ọdịnaya ndị ọzọ, lelee www.finds.life.church.