Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara NDI EFESỌS 3:21

Izụ Ahia N'Ụzọ Nke Ime Mmụọ
Ụbọchị Isii
Ekweerè m na ụgha ruo ọtụtụ afọ. Ụgha a jùrù eju ebe niile Ndị Kraịst nọ. Ekwenyerè m na ezigbo nkewa dị̀ n'etiti ihe ndị bụ ihe nke uwa na ihe ndị dị nsọ. Ma nke ahu ekweghị ka m gaa n'ihu. Sonyere m inyọchà ka Chineke siri chọọ inye anyị ike nke ukwuu iji wètá Eluigwe n'ụwa a, na ime nke ọma na azụmahịa na ndụ. Anyị nwerè ọtụtụ ohere iji metụta ụwa karịa ọtụtụ “ndị n'ezi ozioma oge niile,” ma atụmatụ ihe ọgụgụ nke Akwụkwọ Nsọ a gà-egọsikwa gị otú ịga esi mee ya!

Mee Ohere Maka Ihe Di Mkpa: Ihe Ise Ihe Ọmụme Ndi Nke Ime Mmụọ Maka Lenti
Ụbọchi Asaa
Lentị: oge ntụghari uche na nchegharị nke ụbọchị iri anọ. Ọ bụ echiche mara mma, mana gịnị ka ime Lentị dị kà n'ezie? N'ime ụbọchị asaa na-esote, chọpụta àgwà ime mmụọ ise ị nwerè ike ịmalitè ime n'oge Lentị iji nyere onwe gị aka ịkwado obi gị maka Sonde Mbilite N'ọnwụ—na ụbọchị ndị ọzọ n'esotekwe.

Akwụkwọ Nsọ dị Ndụ
Ụbọchị 7
Kemgbe mmalite oge, okwu Chineke na-eweghachi obi na uche mmadụ - ma Chineke ka nọ n'ọlụ. N'ime ihe ọgụgụ ụbọchị asaa a pụrụ iche, ka anyị too Chineke maka ike n"enwogha ndụ dị na Akwụkwọ Nsọ site na ileba anya n'otú Chineke si eji Akwụkwọ Nsọ emetụta akụkọ ihe gara aga ma gbanwee ndụ mmadụ na mpaghara ụwa.

Gịnị Bụ Ezi Ịhụnanya?
Ụbọchị Iri Na Abụọ
Onye ọ bụla chọrọ ịma ihe ịhụnanya bụ̀ n'ezie. Ma ọ bụ̀ mmadụ ole na ole nà-ele ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara ịhụnanya anya. Ịhụnanya bụ otu n'ime isi okwu nke Akwụkwọ Nsọ na omume kacha mkpa nke ndụ Ndị Kraịst. Atụmatụ ihe ọgụgụ a siteré na Thistlebend Ministries nà-enyocha ihe ịhụnanya pụtarà na Akwụkwọ Nsọ na otù a gà-esi hụ Chineke na ndị ọzọ n'anya n'ụzọ ka nma.