Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara I. JỌN 4:10

Iji Atumanya Chere Ekeresimesi: Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Amụma Ọkwa Ọbịbịa Dị Ụbọchị Ise
Ụbọchị Ise
Ọtụtụ mgbe, oge ezumike na-abịa ma na-aga tupu anyị enwee ohere ilekwasị anya n'ịkwadebe obi anyị maka Ekeresimesi. Amụma Ọkwá Ọbịbịa bụ̀ ụzọ anyị si echeta na Chineke bịara nọnyere anyị, ka nọnyeere anyị, na Ọ ga-abịakwa ọzọ. N'ime ụbọchị ise na-esote, anyị ga-enyocha isiokwu Amụma Ọkwa Ọbịbịa anọ: olileanya, udo, ịhụnanya, na ọṅụ.

20/20: Ahụrụ. Ahọpụtara. E zipụrụ. Nke Christine Caine Derè
Ụbọchị Asaa
Ị̀ nwerè ike ichetù n'echiche otú Chineke ihu gị, lekọta gị anya na ghọta gị nke ọma apụghị ma mee ka ibido huwá ndị mmadụ n'ụzọ dị otú ahụ? Ị̀ nwerè ike ichetù n'echiche na ndụ nkịtị ị n'ebi kwa ụbọchị pụrụ inwe ọkpụrụkpụ mmetụta dị ebighị ebi? Ihe òfùfè a dị ụbọchị asaa sí n'aka Christine Caine gà-enyere gị aka ịchọpụta otú Chineke si wee hútá gị, họrọ gị, wee zipụ gị ịga bido hútawá ndị mmadụ ma nyere ha aka ịdị nhútá na nghọta otú Chineke si wee n'ele ha anya—jiri ọhụhụ́ ụzọ dị 20/20.

Gịnị Bụ Ezi Ịhụnanya?
Ụbọchị Iri Na Abụọ
Onye ọ bụla chọrọ ịma ihe ịhụnanya bụ̀ n'ezie. Ma ọ bụ̀ mmadụ ole na ole nà-ele ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru gbasara ịhụnanya anya. Ịhụnanya bụ otu n'ime isi okwu nke Akwụkwọ Nsọ na omume kacha mkpa nke ndụ Ndị Kraịst. Atụmatụ ihe ọgụgụ a siteré na Thistlebend Ministries nà-enyocha ihe ịhụnanya pụtarà na Akwụkwọ Nsọ na otù a gà-esi hụ Chineke na ndị ọzọ n'anya n'ụzọ ka nma.