
Tupu m budata Ngwá Baịbụl, enweghị m àgwà nke ịgụ Akwụkwọ Nsọ. Ana m n'ege nkụzi Okwu Chineke ebe a na ebe ọzọ ma ya adị m ka ije mụ na Chineke adịghị aga n'ihu. Ugbu a, jírí Ngwá Baịbụl, e nwerè m ike ịhụ, ịgụ ọtụtụ nsụgharị Akwụkwọ Nsọ dị iche iche ma jírí ha mee ihe.
Olu ya n'agụ́rụ́ m ihe merè ka m gụchaa Akwụkwọ Nsọ ugboro abụọ n'otu afọ. Ma Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị dịnụ merè ka m ghọta na ọ dị ihe dị iche n'ịmụ Akwụkwọ Nsọ na naanị ịgụ Ya. Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị n'enyere m aka ịzụlite àgwà m nke ịmụ Akwụkwọ Nsọ ma mụ enwee ike ịkekọrịtara ndị ọzọ ihe m mụtara. Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị dị adị maka ọgụgụ nyeerè m aka ịzụlite na too àgwà ná-adịgidé adịgide nke ịmụ Akwụkwọ Nsọ. A na m agụzù Akwụkwọ Nsọ n'ọnwa isii ma n'agụ Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị ga-enyere m aka ime azụmahịa m n'ụzọ ga-amasị Chineke. Anakwa m agụ Atụmatụ Ihe Ọgụgụ ga-enyere m aka ịbụ ezi nna na ịzụlite nwa m ka Chineke si chọọ na Atụmatụ Ihe Ọgụgụ ga-enyere m aka ịbụ ezi di nye nwunye m.
Ngwá Baịbụl merè ka ọ dịịrị m mfe itinye Akwụkwọ Nsọ n'ọrụ n'akụkụ niile nke ndụ m.