Erika, USA

Erika, USA

Abụ m onye nwere nsogbu nri-ahụ nke ọgwụ n'egbu egbu ruo ihe gafere afọ iri, ma e funahurù m ihe niile. Akpacharà m anya chọọ iji ọgwụ nwụgbuo onwe m, n'ihi na ọ dị m ka enweghịzi m ihe m dị ndụ maka ya. Achọghị m ịnụ ihe ọbụla gbàsará Chineke, n'ihi na oké iwe jurù m obi ma anọ m na nnukwute mgbu-ilu. Abụ m onye furu efù ma nwee owu ọmụma, ma amaghịkwa m ka m gà-èsí mee ka ndụ m dị mma ọzọ. Ihe m n'amaghị oge ahụ bụ̀ na ihe dị mkpa abụghị etù m kwesịrị isi mee ka ndụ m rụwa ọrụ ọzọ--ọ bụ̀ Onye dị ike imezi ya.

Ruo afọ abụọ ugbu a, ahụwo m mgbanwe n'ime m mmaarà na ọbụ̀ naanị Jizọs meerè m ya. Site na Amaokwu Nke Ụbọchị Taa, Akwụkwọ Nsọ Eduziri Eduzi, na Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị, enwewo m obi ụtọ n'itorukwú Chineke nso na ime ka mgbọrọgwụ m n'ime Ya sikwuo ike. Ana m ènwetá ọkwá-ozi nke Amaokwu Nke Ụbọchị Taa, ya ana-echetara m ka m gụọ Akwụkwọ Nsọ m kwa ụbọchị. Ugbu a, ana m èlé anya n'azụ wee ghọta na Ọ nọnyeerè m oge niile ahụ, naanị ná-ècheré m ka m meghee obi m wee nabata Ya.