YouVersion Logo
Search Icon

FAILIMON 1

1
1Pọl, onye-nkpọrọ nke Kraist Jisus, na Timọti nwa-nna-ayi nēdegara Failimon akwukwọ, bú onye ayi huru n'anya, onye ayi na ya nālukọ kwa ọlu, 2nēdega-kwa-ra Apfia nwa-nna-ayi nwanyi, na Akipọs onye ayi na ya nēbukọ agha, na nzukọ Kraist di n'ulo-gi: 3Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.
4Anamekele Chinekem mb͕e nile mb͕e m'necheta gi n'ekperem nile, 5ebe m'nānu okwu bayere ihu-n'anya-gi na okwukwe-gi, bú okwukwe i kwere n'Onye-nwe-ayi Jisus, na ihu-n'anya i huru ndi nsọ nile; 6ekpere m'nēkpe bu ka nnwekọ nke okwukwe-gi we ghọ ihe nālusi ọlu ike, nime nmazu nke ezi ihe nile ọ bula nke di nime ayi, rue na Kraist. 7N'ihi na enwerem ọtutu ọṅù na nkasi-obi n'ihi ihu-n'anya-gi, n'ihi na obi ndi nsọ ezuwo ike site n'aka-gi, nwa-nnam.
8N'ihi nka, ọ bu ezie na enwerem oké nkwuwa-okwu nime Kraist iwere ihe nke kwesiri nye gi n'iwu, 9ma n'ihi ihu-n'anya ahu ọ kam nma iriọ aririọ, ebe m'bu nání aha madu dika Pọl, bú agadi, buru kwa onye-nkpọrọ nke Kraist Jisus ub͕u a: 10ariọm gi aririọ bayere nwa nkem, onye m'muru nime ab͕um, bú Ọnisimọs, 11onye buri onye nābaghi n'ihe n'ebe i nọ n'oge gara aga, ma ub͕u a ọ bara gi n'ihe, ba-kwa-ram n'ihe: 12onye m'nēzighachiri gi, ya onye-ya, nke ahu bu, obi nkem: 13onye mu onwem nēzuberi ijide ka mu na ya nọdu, ka o we nējerem ozi n'ab͕u nke ozi ọma n'ọnọdu gi: 14ma achọghm ime ihe ọ bula mb͕e i kēkweyeghi; ka idi-nma-gi we ghara idi ka agāsi na ọ di n'uzọ nkpà, kama ka o we di n'uzọ ọchichọ-obi-gi. 15N'ihi na eleghi anya ọ bu n'ihi nka ka ekewapuru ya n'ebe i nọ nwa oge ntà, ka i we nwe ya ebighi-ebi; 16ọ dighi kwa ka orù ọzọ, kama ọ kariri orù, ọ di ka nwa-nna ahuru n'anya, nke kachasinu n'ebe m'nọ, ma nke kariri nke ahu nke-uku n'ebe i nọ, nime anu-aru na nime Onye-nwe-ayi kwa. 17Ya mere ọ buru na i gurum n'onye-nnwekọ, nara ya nke-ọma dika mu onwem. 18Ma ọ buru na o mejọrọ gi n'uzọ ọ bula, ma-ọbu na o ji gi ugwọ ọ bula, gua ya n'ugwọ m'ji gi; 19Mu onwem, bú Pọl, were aka nkem de ya n'akwukwọ a, mu onwem gākwughachi ya: ka m'ghara igwa gi na ọ bu kwa onwe-gi ka i jim n'ugwọ tukwasi ihe ọzọ. 20E, nwa-nnam, kwe ka mu onwem nwe obi-utọ n'aru gi nime Onye-nwe-ayi: me ka obim zuru ike nime Kraist. 21Ebe m'tukwasiworo obi n'iṅa-nti-gi anamedegara gi akwukwọ, n'ihi na amataram na i gēme ọbuná kari ihe m'nēkwu. 22Ma ọzọ kwa, dozi-kwa-ram ebe m'gānọ dika ọbìa: n'ihi na anamele anya na agēwerem nye unu n'amara site n'ekpere-unu.
23Epafras, onye adọkọro mu na ya n'agha nime Kraist Jisus, nēkele gi; 24ọ bu kwa otú a Mak na Aristakọs na Dimas na Luk, bú ndi mu na ha nālukọ ọlu, nēkele unu.
25Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist diyere mọ-unu. Amen.

Currently Selected:

FAILIMON 1: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy