YouVersion Logo
Search Icon

ỌNU-ỌGUGU 1

1
1Jehova we gwa Moses okwu n'ọzara Sainai, n'ulo-ikwū nzute, n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-abua, n'arọ nke-abua nke ọpupu ha puru n'Ijipt, si, 2Gutanu ọnu-ọgugu nzukọ nile nke umu Israel, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha nile, nwoke ọ bula, onye na isi-ya onye na isi-ya; 3site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha n'Israel, unu gāgukọta ha, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di, gi onwe-gi na Eron. 4Madu ganọye-kwa-ra unu, otù nwoke gādiri otù ebo; nwoke ọ bula, onye-isi ulo nna-ya-hà ka ọ bu. 5Ndia bu kwa aha ndikom unu na ha gēguzo: nke Reuben; Elizua nwa Shedeua. 6Nke Simeon; Shelumiel nwa Zurishadai. 7Nke Juda, Nahshon nwa Aminadab. 8Nke Isaka; Netanel nwa Zua. 9Nke Zebulun; Eliab nwa Hilon. 10Nke umu Josef: nke Efraim; Elishama nwa Amihud: nke Manase; Gameliel nwa Pedahzua. 11Nke Benjamin; Abidan nwa Gideoni. 12Nke Dan; Ahieza nwa Amishadai. 13Nke Asha; Pagiel nwa Ọkran. 14Nke Gad; Eliasaf nwa Deuel. 15Nke Naftali; Ahira nwa Inan. 16Ndia bu ndi akpọrọ nke nzukọ Israel, ndi-isi ebo nile nke ndi bu nna-ha; ndi-isi nke usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Israel ka ha bu. 17Moses na Eron we chiri ndikom ndia nke akpọrọ n'aha n'aha: 18ọ bu kwa nzukọ Israel nile ka ha kpọkọtara n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-abua, ha we kọ akukọ osuso-ọmumu-ha dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye na isi-ya onye na isi-ya. 19Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka ọ gukọtara ha n'ọzara Sainai.
20Ma umu Reuben, bú ọkpara Israel, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, onye na isi-ya onye na isi-ya, nwoke ọ bula site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha; 21ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Reuben, ha di orú nnù uzọ ise na nnù iri-na-isi na ọgu ise.
22Nke umu Simeon, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, ndi-ha agukọtara agukọta, n'ọnu-ọgugu aha, onye na isi-ya onye na isi-ya, nwoke ọ bula site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha; 23ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Simeon, ha di orú nnù uzọ asa na nnù asatọ na ọgu ise.
24Nke umu Gad, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha; 25ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Gad, ha di orú nnù uzọ ise na nnù iri-na-anọ na ọgu abua na iri.
26Nke umu Juda, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'onu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara oru arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha; 27ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Juda, ha di orú nnù uzọ iteghete na nnù isi na ọgu iri.
28Nke umu Isaka, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha; 29ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Isaka, ha di orú nnù uzọ isi na nnù iri-na-isi.
30Nke umu Zebulun, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha; 31ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Zebulun, ha di orú nnù uzọ asa na nnù atọ na ọgu iri.
32Nke umu Josef, bú nke umu Efraim, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha; 33ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Efraim, ha di orú nnù uzọ ise na nnu na ọgu ise.
34Nke umu Manase, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha; 35ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Manase, ha di orú nnù uzọ anọ na ọgu iri.
36Nke umu Benjamin, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha; 37ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Benjamin, ha di orú nnù uzọ anọ na nnù asatọ na ọgu iri.
38Nke umu Dan, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ogugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha; 39ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Dan, ha di orú nnù uzọ asa na nnù iri-na-isi na ọgu iri-na-ise.
40Nke umu Asha, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnu-ọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha; 41ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Asha, ha di orú nnù uzọ ise na nnù atọ na ọgu iri-na-ise.
42Nke umu Naftali, osuso-ọmumu nile ha, dika ab͕uru nile ha si di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, n'ọnuọgugu aha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha; 43ndi-ha agukọtara agukọta, ndi diri ebo Naftali, ha di orú nnù uzọ isi na nnù iri-na-atọ na ọgu iri.
44Ndia bu ndi agukọtara agukọta, ndi Moses na Eron gukọtara, ha na ndi-isi Israel, bú ndikom iri na abua: otù nwoke otù nwoke diri ulo nna-ya-hà ka ha bu. 45Ndi nile nke umu Israel agukọtara agukọta we di, dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, onye ọ bula nke nāpukuru usu ndi-agha n'Israel; 46ọbuná ndi nile agukọtara agukọta we di orú nnù ọgu uzọ atọ na uzọ iri-na-ise, na nnù asatọ, na ọgu iri-na-asa, na iri.
47Ma ndi Livai, dika ebo nke ndi bu nna-ha si di, agukọtaghi ha n'etiti ha. 48N'ihi na Jehova gwara Moses okwu, si, 49Nání, agukọtala ebo Livai, aguta-kwa-la ọnu-ọgugu-ha n'etiti umu Israel: 50ma gi onwe-gi me ndi Livai ka ha buru ndi nēlekọta ebe-obibi ihe-àmà, ndi nēlekọta kwa lhe-ya nile, ndi nēlekọta kwa ihe nile diri ya: ha onwe-ha ganēbu ebe-obibi ahu, na ihe-ya nile: ha onwe-ha gēje-kwa-ra ya ozi, ọ bu kwa buruburu ebe-obibi ahu ka ha gāma ulo-ikwū-ha. 51Ma na nbuli-ije nke ebe-obibi ahu, ndi Livai gēweda ya: ọzọ, n'ọmuma nke ebe-obibi ahu, ndi Livai gēguzo ya ọtọ: ma onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua. 52Umu Israel gāma kwa ulo-ikwū-ha, nwoke ọ bula n'akuku ọmuma-ulo-ikwū-ya, na nwoke ọ bula n'akuku ọkọlọtọ-ya, dika usu nile nke ndi-agha-ha si di. 53Ma ndi Livai gāma ulo-ikwū-ha buruburu ebe-obibi ihe-àmà ahu, ka iwe we ghara idi n'aru nzukọ umu Israel: ndi Livai gēdebe kwa ihe-ndebe nke ebe-obibi ihe-àmà ahu. 54Umu Israel we me otú a; dika ihe nile nke Jehova nyere Moses n'iwu si di, otú a ka ha mere.

Currently Selected:

ỌNU-ỌGUGU 1: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy