YouVersion Logo
Search Icon

LUK 5

5
1Ma o rue, mb͕e ìgwè madu nādagide Ya nānu kwa okwu Chineke, na Ya onwe-ya nēguzo n'usọ ọdọ-miri Genesaret; 2O we hu ub͕ọ abua ka ha guzoro n'usọ ọdọ-miri ahu: ma ndi-ọkù esiwori nime ha pua, ha nāsa kwa ihe ha ji eb͕u azù. 3O we ba n'otù nime ub͕ọ abua ahu, nke bu nke Saimon, we kpere ya ka o si n'ala nupu nke-ntà. O we nọdu, si n'ub͕ọ nēzí ìgwè madu nile ihe. 4Ma mb͕e O kwubìri okwu, Ọ si Saimon, Nupu n'ob͕u-miri, wunyenu ihe unu ji eb͕u azù ka unu b͕ue azù. 5Saimon we za, si, Nna-ayi, ayi dọb͕uru onwe-ayi n'ọlu ogologo abali a dum, ma ayi eb͕utaghi ihe ọ bula: ma n'okwu-Gi m'gāwuye ihe eji eb͕u azù. 6Mb͕e ha mesiri nka, ha we nwuta oké ìgwè azù, ihe-ha eji eb͕u azù we nādọka; 7ha we fere ndi-nketa-ibe-ha aka, bú ndi nọ n'ub͕ọ-ha ọzọ, ka ha bia nyere ha aka. Ha we bia, b͕ujue ub͕ọ̀ abua ahu, ya mere ha malitere imìkpu. 8Ma mb͕e Saimon Pita huru ya, o we da n'ala n'ikperè Jisus, si, Si n'ebe m'nọ pua; n'ihi na abum onye-nmehie, Onye-nwe-ayi. 9N'ihi na ibobo ob͕ub͕u azù ha b͕uru nwuru ya na ndi nile ya na ha nọ n'aru; 10otú ahu ka ibobo nwu-kwa-ra Jemes na Jọn, umu Zebedi, n'aru, ndi ha na Saimon bu ndi-nnweko. Jisus we si Saimon, Atula egwu; site n'ub͕u a i ganānwuta madu na ndu. 11Mb͕e ha tinyere ubọ-ha n'ala, ha we rapu ihe nile, so Ya.
12O rue, mb͕e Ọ nọ n'otù nime obodo ahu, le, otù nwoke nke ekpenta juputara n'aru: ma mb͕e ọ huru Jisus o da kpuchie iru-ya n'ala, riọ Ya, si, Onye-nwe-ayi, ọ buru na I nāchọ, I puru ime ka m'di ọcha. 13O we setipu aka-Ya, metu ya, si, Anamachọ; ka eme ka i di ọcha. Ngwa ngwa ekpenta ahu we rapu ya. 14Ya onwe-ya we nye ya iwu ka ọ ghara igwa onye ọ bula: Ọ si kwa ya, Kama laba, were onwe-gi gosi onye-nchu-àjà, che kwa n'iru Chineke ihe bayere ime gi ka i di ọcha, dika Moses nyere n'iwu, ka ọ buru ha àmà. 15Ma okwu bayere Ya fesakariri nke-uku: oké ìgwè madu we nāb͕akọ inu okwu-Ya, ka ewe me kwa aru-ha nke nādighi nma ka ọ di ike. 16Ma Ya onwe-ya nēwezuga Onwe-ya n'ebe bu ọhia, nēkpe kwa ekpere.
17O rue n'otù nime ubọchi ahu, na Ya onwe-ya nēzi ihe; ndi-Farisi na ndi-ozizí iwu Moses nānọ kwa Ya nso, ndi siri n'obodo ntà nile nke Galili na Judia na Jerusalem puta: ike nke Onye-nwe-ayi diye-kwa-ra Ya ime ka aru di madu ike. 18Ma le, ndikom butere otù nwoke akuku-aru-ya nwuru anwu n'elu ihe-ndina: ha we nāchọ uzọ ibubata ya, na itọb͕ọ ya n'iru Ya. 19Ebe ha nāhughi uzọ ha gēsi bubata ya n'ihi ìgwè madu ahu, ha we rigo n'elu ulo, we si n'okpukpu ulo buda ya na ute-ya n'etiti n'iru Jisus. 20Mb͕e Ọ huru okwukwe-ha, Ọ si, Nwoke, ab͕agharawo gi nmehie-gi nile. 21Ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi we malite itule n'obi-ha, si, Ònye bu Nwoke a nke nēkwu okwu nkwulu? Ònye puru ib͕aghara nmehie, ma-ọbughi nání Chineke? 22Ma ebe Jisus mazuru ihe ha nātule n'obi-ha, Ọ za, si ha, Gini mere unu nātule ihe n'obi-unu? 23Òle nke ka nfé, isi, Ab͕agharawo gi nmehie-gi nile; ma-ọbu isi, Bilie, jeghari kwa? 24Ma ka unu we mata na Nwa nke madu nwere ike n'elu uwa ib͕aghara nmehie (Ọ si onye ahu ukwu-ya nwuru anwu), M'si gi, Bilie, chiri ute-gi, laa n'ulọ gi. 25Ngwa ngwa o we bilie n'iru ha, chiri ihe o ji dina, je ulo-ya, nēto Chineke. 26Ibobo we nwua ha nile n'aru, ha we to Chineke; egwu juputa-kwa-ra ha n'obi, ha si, Ayi ahuwo ihe-ebube ta.
27Mb͕e ihe ndia gasiri Ọ pua, hu onye-ọna-utu, nke anākpọ aha-ya Livai, ka ọ nọduru n'ulo-ùtú, Ọ si ya, Som. 28O we rapu ihe nile, bilie, so Ya. 29Livai we siere Ya nri uku n'ulo-ya iji nara Ya nke-ọma: oké ìgwè ndi-ọna-utu na ndi ọzọ di kwa ndi soro ha nọdu na nri. 30Ndi-Farisi na ndi-ode-akwukwọ-ha we tamube imegide ndi nēso uzọ-Ya, si, N'ìhi gini ka unu nēso ndi-ọna-utu na ndi-nmehie ndia nēri ihe? 31Jisus we za, si ha, Nkpà dibia akpaghi ndi aru di nma; kama ọ nākpa ndi aru nādighi nma. 32Abiaghm ikpọ ndi ezi omume kama ọ bu ndi-nmehie ka ha chègharia. 33Ha we si Ya, Ndi nēso uzọ Jọn nēbu ọnu ọtutu mb͕e, nāriọ kwa aririọ; otú ahu ka ndi nēso uzọ ndi-Farisi nēme kwa; ma ndi nke Gi nēri nāṅu kwa. 34Ma Jisus siri ha, Ọ̀ gābu na unu puru ime ka umu-ndikom nke ulo anālu nwunye ọhu bue ọnu, mb͕e ha na Onye nālu nwunye ọhu nānọ? 35Ma ubọchi gābia; mb͕e agānapu kwa ha Onye nālu nwunye ọhu, mb͕e ahu ka ha gēbu ọnu n'ubọchi ahu. 36O we tu-kwa-ra ha ilu, si, Ọ dighi onye ọ bula nādọkapu iberibe ákwà ọb͕ub͕a n'uwe ọhu tukwasi ya n'uwe ochie; eme otú a, ọ gādọka nke-ọhu, ọzọ kwa, iberibe ákwà ọb͕ub͕a si n'uwe ọhu ahu puta agaghi-adabà na nke-ochie. 37Ọ dighi kwa onye ọ bula nāb͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ochie; eme otú a, manya-vine ọhu gāb͕awa karama-akpukpọ, manya onwe-ya gāwusì, karama-akpukpọ ahu gāla kwa n'iyì. 38Ma aghaghi ib͕aye manya-vine ọhu na karama-akpukpọ ọhu. 39Ọzọ kwa, ọ dighi onye ọ bula, mb͕e ọ ṅuworo manya-vine ochie, nāchọ nke-ọhu: n'ihi na ọ si, Nke-ochie di nma.

Currently Selected:

LUK 5: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy