YouVersion Logo
Search Icon

JỌN 18

18
1Mb͕e Jisus kwusiri okwu ndia, Ọ pua, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, gabiga n'ofè iyi Kidron, ebe ubi ab͕ara ogige di, nke Ọ bàra nime ya, Ya onwe-ya na ndi nēso uzọ-Ya. 2Ma Judas, onye nārara Ya nye, mata-kwa-ra ebe ahu: n'ihi na Jisus na ndi nēso uzọ-Ya zukọrọ n'ebe ahu ọtutu oge. 3Ya mere Judas, ebe ọ natara òtù ndi-agha, na ndi nēje ozi site n'aka ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi, ọ chiri oriọna na ọwa na ihe-agha bia n'ebe ahu. 4Ya mere Jisus, ebe Ọ matara ihe nile nābiakwasi Ya, Ọ pua, si ha, Ònye ka unu nāchọ? 5Ha zara Ya, si, Jisus Onye Nazaret. Jisus siri ha, Mu onwem bu Ya. Ma Judas, onye nārara Ya nye, nēguzo kwa n'etiti ha. 6Ya mere mb͕e Ọ siri ha, Mu onwem bu Ya, ha la azu, we da n'ala. 7Ya mere Ọ juru ha ọzọ, si, Ònye ka unu nāchọ? Ha si, Jisus Onye Nazaret. 8Jisus zara, si, Agwaram unu na Mu onwem bu Ya: ya mere ọ buru na unu nāchọm, ka ndia la: 9ka okwu O kwuru we mezu, si, N'etiti ndi I nyeworom ọ dighi onye ọ bula M'tufuru. 10Ya mere Saimon Pita, ebe o ji mma-agha, ọ miputa ya, b͕ue orù onye-isi-nchu-àjà mma, bipu nti aka-nri ya. Ma aha orù ahu bu Malkọs. 11Ya mere Jisus siri Pita, Miye mma-agha-gi n'ọbọ-ya: iko nke Nnam nyeworom, M'gaghi-aṅu ya?
12Ya mere òtù ndi-agha ahu na ọchi-agha, na ndi nējere ndi-Ju ozi, jidere Jisus ke kwa Ya ab͕u, 13we buru uzọ duru Ya jekuru Anas; n'ihi na ya bu nna nwunye Kaiafas, onye bu onye-isi-nchu-àjà arọ ahu. 14Ma Kaiafas bu onye ahu nke dururi ndi-Ju ọdú, na ọ bara urù ka otù onye nwua n'ọnọdu ndi-Ju.
15Saimon Pita we so Jisus, ya na onye ọzọ nke nēso uzọ Jisus. Ma onye ahu nke nēso uzọ Jisus bu onye onye-isi-nchu-aja mara, o we so Jisus ba n'obí onye-isi-nchu-àjà; 16ma Pita nēguzo n'èzí n'ọnu-uzọ. Ya mere onye ọzọ ahu nke nēso uzọ Jisus, onye onye-isi-nchu-àjà mara, we pua gwa nwanyi nke nēche ọnu-uzọ okwu, we dubata Pita. 17Ya mere nwa-ab͕ọghọ ahu nke nēche ọnu-uzọ si Pita, Ọ̀ gābu na gi onwe-gi bu kwa otù onye n'etiti ndi nēso uzọ Nwoke a? Pita si, Abughi m. 18Ma ndi-orù na ndi nēje ozi guzoro n'ebe ahu, ebe ha funwusiri ọku icheku; n'ihi na oyi nātu; ha nānya kwa ọku: Pita nọ kwa n'etiti ha, nēguzo nānya kwa ọku.
19Ya mere onye-isi-nchu-àjà juru Jisus ajuju bayere ndi nēso uzọ-Ya, na ajuju bayere ozizí-Ya. 20Jisus zara ya, si, Mu onwem agwawawo uwa okwu; Mu onwem zíri ihe mb͕e nile n'ulo-nzukọ, na n'ulo uku Chineke, ebe ndi-Ju nile nāb͕akọ; ekwukwaghi m ihe ọ bula na nzuzo. 21Gini mere i nāju Mu onwem? jua ndi nuworo okwum, ihe M'gwara ha: le, ndia matara ihe nile Mu onwem kwuru. 22Ma mb͕e O kwusiri okwu ndia, otù onye nime ndi nēje ozi nke nēguzo nso we pia Jisus ihe, si, Ì nāza onye-isi-nchu-àjà otú a? 23Jisus zara ya, si, Ọ buru na M'kwuru nke-ọjọ, b͕ara ihe ọjọ ahu àmà: ma ọ buru nke-ọma, gini mere i nētim aka? 24Ya mere Anas zigara Ya n'ab͕u jekuru Kaiafas onye-isi-nchu-àjà.
25Ma Saimon Pita nēguzo nānya kwa ọku. Ya mere ha siri ya, Ọ̀ gābu na gi onwe-gi bu kwa otù onye nime ndi nēso uzọ-Ya? Onye ahu gọrọ, si, Abughi m. 26Otù onye nime ndi-orù onye-isi-nchu-àjà, buri onye-ikwu nke onye ahu Pita bipuru nti-ya, si, Mù onwem ahughi gi na Ya n'ubi ahu ab͕ara ogige? 27Ya mere Pita gọ-kwa-ra ọzọ: ngwa ngwa oke-ọkuku we kwa.
28Ya mere ha si na nke Kaiafas duru Jisus ba na Pritoriọm: ọ bu kwa n'isi-ututu; ma ha onwe-ha abàghi nime Pritoriọm ahu, ka aghara imeru ha, kama ka ha we rie oriri ngabiga. 29Ya mere Pailat pukuru ha n'èzí, si, Ọ̀ bu ebubo gini ka unu nēbo Nwoke a? 30Ha zara, si ya, Ọ buru na Onye a abughi onye nēme ihe ọjọ, ayi agaghi-ararawori Ya nye n'aka-gi. 31Ya mere Pailat siri ha, Unu onwe-unu were Ya, kpe-kwa-nu Ya ikpé dika iwu-unu si di. Ndi-Ju siri ya, O zighi ayi ezi n'iwu ib͕u onye ọ bula: 32ka okwu Jisus we mezu, nke O kwuru, nēgosi aha ọnwu Ọ gajē inwu.
33Ya mere Pailat bà-kwa-ra ọzọ nime Pritoriọm, we kpọ Jisus, si Ya, Gì onwe-gi bu Eze ndi-Ju? 34Jisus zara, si, Gì onwe-gi nēkwu nka n'onwe-gi, ma-ọbu na ndi ọzọ gwara gi okwu bayerem? 35Pailat zara, si, Mù onwem bu onye-Ju? Mba nke Gi na ndi-isi-nchu-àjà rara Gi nye n'akam: gini ka I mere? 36Jisus zara, si, Ala-ezem esiteghi n'uwa nka: ọ buru na ala-ezem sitere n'uwa nka, ndi nējerem ozi gālu ọ̀gù, ka aghara iraram nye n'aka ndi-Ju: ma ub͕u a ala-ezem esighi n'ebe a puta. 37Ya mere Pailat siri Ya, Gì onwe-gi bu kwa eze? Jisus zara, si, Gi onwe-gi nāsi na Mu onwem bu eze. Amuwo Mu onwem ime ihe a, abiawokwam nime uwa ime ihe a, ka M'we b͕ara ezi-okwu àmà. Onye ọ bula nke sitere n'ezi-okwu ahu nānu olum. 38Pailat si Ya, Gini bu ezi-okwu?
Mb͕e o kwusiri nka, o we pukuru ndi-Ju ọzọ, si ha, Mu onwem ahughi ihe kwesiri ahuhu-nmehie nime Ya. 39Ma unu nwere ome-n'ala, ka m'rapuru unu otù onye n'ememe ngabiga: ùnu nēzube kwa ka M'rapuru unu Eze ndi-Ju? 40Ya mere ha tiri nkpu ọzọ, si, Ọ bughi Onye a, kama ọ bu Barabas. Ma Barabas bu onye nāpunara madu ihe.

Currently Selected:

JỌN 18: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy