YouVersion Logo
Search Icon

II. PITA 1

1
1Saimon Pita, orù na onye-ozi nke Jisus Kraist, nēdegara unu akwukwọ, bú ndi ketaworo okwukwe di oké ọnu-ahia ra ka nke ayi ketaworo n'ezi omume Onye ahu, bú Chineke-ayi na Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist; 2Ka eme ka amara bara unu uba, ya na udo, nime nmazu nke Chineke na nke Jisus Onye-nwe-ayi; 3dika ike O ji buru Chineke nyeworo n'aka-ayi ihe nile di ndu na nsọpuru-Chineke n'efu, site na nmazu nke Onye ahu Onye ji ebube na idi-nma nke aka Ya kpọ ayi; 4bú nke O siteworo nye n'aka-ayi nkwa nile ahu di oké ọnu-ahia di kwa uku ri nne; ka unu we site n'ihe ndia ghọ ndi nēnwekọ ihe O ji buru Chineke, ebe unu b͕anariworo nmebi nke di n'uwa site n'agu ihe ọjọ. 5Ma n'ihi otù ihe a n'akuku-unu tukwasinu inu-ọku-n'obi nile, nyezu-kwa-nu idi-nma n'okwukwe-unu; nyezu kwa ihe-ọmuma n'idi-nma-unu; 6nyezu kwa ijisi-onwe-unu-ike n'ihe-ọmuma-unu; nyezu kwa ntachi-obi n'ijisi-onwe-unu-ike; nyezu kwa nsọpuru-Chineke nime ntachi-obi-unu; 7nyezu kwa ihuunanya umu-nna nime nsọpuru-Chineke-unu; nyezu kwa ihu-n'anya nime ihu-n'anya-umu-nna-unu. 8N'ihi na asi na unu nwere ihe ndia, asi kwa na unu nwere ha ri nne, ha nēdo unu ndi nābughi ndi nādighi-alu ọlu ma-ọbu ndi nādighi-ami nkpuru rue imazu Onye-nwe-ayi Jisus Kraist. 9N'ihi na onye ahu ihe ndia nādighi ya nso bu onye kpuru ìsì, onye nāhu inyoghi-inyoghi, ebe ọ chezọrọ nsachapu nke nmehie ochie ya nile. 10N'ihi nka, umu-nnam, nānunu ọku n'obi kari ime ka ọkpukpọ-unu na nrọputa-unu buru ihe nēguzosi ike: n'ihi na asi na unu e#me ihe ndia, unu agaghi-asu ngọngọ mb͕e ọ bula ma-oli: 11n'ihi na otú a ka agēnyezu unu n'àkù nbata ahu unu gābata nime ala-eze ebighi-ebi nke Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist.
12N'ihi nka mb͕e dum agajem ichetara unu ihe ndia, ọ bu ezie na unu matara ha, emewo kwa ka unu guzosie ike n'ezi-okwu ahu nke dinyere unu. 13Ma anamagu ya n'ihe ziri ezi, ka oge ra m'nọ n'ulo-ikwū a, ikpali unu n'ichetara unu; 14ebe m'matara na ntupu nke ulo-ikwūm nka nābia ọsọsọ, ọbuná dika Onye-nwe-ayi Jisus Kraist gosirim. 15E, m'gānu ọku n'obi ka unu we nwe ike icheta ihe ndia n'oge nile ọ bula mb͕e m'lasiri. 16N'ihi na ayi esoghi akukọ-irò nke eji amam-ihe kọ, mb͕e ayi mere ka unu mara ike na ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ma emere ayi ka ayi buru ndi huru idi-uku nke Onye ahu. 17N'ihi na Ọ natara nsọpuru na ebube n'aka Chineke, bú Nna, mb͕e Ebube ahu nke kwesiri idi-uku mere ka olu di otú a dara Ya, si, Onye a bu Ọkparam M'huru n'anya, Onye ihe-Ya di Mu onwem ezi nma: 18olu a ka ayi onwe-ayi nukwara ka o nēsi n'elu-igwe da, mb͕e ayi na Ya nọ n'ugwu ahu di nsọ. 19Eme-kwa-ra ka okwu amuma ahu guzosiere ayi ike kari; nke unu nēme nke-ọma n'iṅa nti ya, dika oriọna mb͕e ọ nēnwu n'ebe b͕ara ọchichiri, rue mb͕e chi gābọ, kpakpando chi-ọbubọ we tibe n'obi-unu: 20ebe unu buru uzọ mara nka, na ọ dighi amuma ọ bula n'ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nke madu puru ikọ isi-ya site na nání uche nke aka ya. 21N'ihi na ọ dighi amuma ọ bula nke eji ọchichọ madu bu mb͕e ọ bula: kama madu sitere na Chineke kwue okwu, mb͕e Mọ Nsọ nēme ka ha kwue.

Currently Selected:

II. PITA 1: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy