YouVersion Logo
Search Icon

I. TIMỌTI 1

1
1Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus dika ihe ahu si di, nke Chineke, bú Onye-nzọputa-ayi, na Kraist Jisus, bú Onye ayi nēle anya Ya, nyere n'iwu; 2anamedegara Timọti akwukwọ, bú ezi nwam n'okwukwe: Amara na ebere na udo diri gi nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Kraist Jisus Onye-nwe-ayi puta.
3Dika m'riọrọ gi ka i nọgide n'Efesọs, mb͕e m'gaje iga nime Masedọnia, ka i we nye madu ufọdu iwu ka ha ghara izí ihe di iche, 4ka ha ghara kwa iṅa nti akukọ-ifò di iche iche na akukọ osuso-ọmumu di iche iche nādighi-agwu agwu, nke bu ihe nākpata ajuju, kari ikpata ọchichi-èzí-na-ulo nke Chineke nke di nime okwukwe: otú a ka m'nēme ub͕u a. 5Ma ihe ezubere iweta n'iwu ahu bu ihu-n'anya sitere n'obi ọcha na ezi akọ-na-uche na okwukwe nke iru-abua nādighi ya: 6nke madu ufọdu, ebe ha hiere ha, ha siri nime ha jehie we kwue okwu efu; 7chọ kwa ibu ndi-ozizí nke iwu, ọ bu ezie na ha aghọtaghi ihe ha nēkwu, ha aghọtaghi kwa ihe ahu ha nēkwusi ike bayere ha. 8Ma ayi matara na iwu ahu di nma, ma ọ buru na onye ọ bula ewere ya me ihe n'uzọ kwesiri iwu, 9ebe ọ matara nka, na adighi-enye onye ezi omume iwu, kama anēnye ndi nēmebi iwu, ndi nēkweghi kwa idi n'okpuru iwu, nye ndi nāsọpurughi Chineke, ndi bu kwa ndi-nmehie, nye ndi nādighi ọcha n'obi, ndi emeru-kwa-ra emeru, nye ndi nēb͕u nna-ha na ndi nēb͕u nne-ha, nye ndi nēb͕u madu, 10nye ndi nākwa iko, nye ndikom nēmeru onwe-ha n'aru ndikom, nye ndi nēzu madu n'ori, nye ndi-ugha, nye ndi nāṅu iyi ugha, ma ọ buru kwa na ihe ọ bula ọzọ di iche di nēmegide ozizí ahu nke nēnye ezi ndu; 11dika ozi ọma nke ebube nke Chineke di ngọzi si di, nke enyere mu onwem n'aka na ntukwasi-obi idebe.
12Anamekele Onye ahu Nke merem ka m'di ike, bú Kraist Jisus Onye-nwe-ayi, n'ihi na Ọ gurum n'onye kwesiri ntukwasi-obi, ebe O deberem ijere Ya ozi; 13ọ bu ezie na abum onye nēkwulu Chineke na mbu, buru kwa onye-nsob͕u, na onye nēme madu ihe-ihere: otú ọ di, O merem ebere, n'ihi na emerem ya nāmaghi ama nime ekweghi-ekwe; 14ma amara nke Onye-nwe-ayi, ya na okwukwe na ihu-n'anya nke di nime Kraist Jisus, riri nne nke-uku. 15Okwu a kwesiri ntukwasi-obi, kwesi kwa ka anara ya nke-ọma n'uzọ nile ọ bula, na Kraist Jisus biara n'uwa izọputa ndi-nmehie; ndi mu onwem bu onye-isi-ha: 16otú ọ di, ọ bu n'ihi nka ka emerem ebere, ka o we buru nime mu onwem, bú onye-isi, ka Jisus Kraist gēgosi ogologo-ntachi-obi-Ya nile, ka m'buru ihe ilere anya n'etiti ndi gaje ikwere na Ya ka ha nata ndu ebighi-ebi. 17Ma Eze nke mb͕e nile, Nke anāpughi imebi emebi, Nke anāpughi ihu anya, Onye nání Ya bu Chineke, nsọpuru na otuto diri Ya rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.
18Iwu a ka m'nēnye n'aka-gi idebe, nwam Timọti, dika amuma nile si di nke eburu uzọ bu bayere gi, ka i we were ha bu agha ọma nka; 19nēnwe okwukwe na ezi akọ-na-uche; nke ufọdu nupuru n'ebe ha nọ, ub͕ọ-ha we kpùe n'ebe okwukwe-ayi di: 20ndi Haimeniọs na Aleksanda nọ n'etiti ha; ndi m'rara nye n'aka Setan, ka ewe site n'ahuhu zí ha ka ha ghara ikwulu Chineke.

Currently Selected:

I. TIMỌTI 1: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy