YouVersion Logo
Search Icon

LUK 6

6
1O rue na Ọ nāga n'etiti ubi ọka n'ubọchi-izu-ike; ndi nēso uzọ-Ya we nāghọ oko ọka, nāta, nāmazu ha n'aka-ha. 2Ma ufọdu nime ndi-Farisi siri, Gini mere unu nēme ihe nēzighi ezi n'iwu ime n'ubọchi-izu-ike? 3Jisus we za ha, si, Ùnu agughi ọbuná ihe a, nke Devid mere, mb͕e agu guru ya, ya onwe-ya na ndi soro ya; 4otú ọ batara n'ulo Chineke, were kwa ob͕e achicha anēche n'iru Chineke rie ya, o we nye kwa ndi ya na ha yikọ; nke nēzighi ezi n'iwu ka ha rie, ma nání ndi-nchu-àjà ka o ziri ezi? 5O we si ha, Nwa nke madu bu Onye-nwe ubọchi-izu-ike.
6O we rue n'ubọchi-izu-ike di iche, na Ọ batara n'ulo-nzukọ-ha, we nēzí ihe: otù nwoke nọ kwa n'ebe ahu, aka-nri-ya kpọnwu-kwa-ra akpọnwu. 7Ma ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi nēche Ya, ma Ọ gēme ka aru-ya di ike n'ubọchi-izu-ike; ka ha we hu ihe ha gēji bo Ya ebubo. 8Ma Ya onwe-ya matara ihe ha nātule n'obi; O we si nwoke ahu aka-ya kpọnwuru akpọnwu, Bilie, guzo n'etiti. O we bilie, guzo kwa. 9Jisus we si ha, Anamaju unu, Ò ziri ezi n'iwu ime ezi ihe, ma-ọbu ime ihe ọjọ, n'ubọchi-izu-ike? ìzọ̀puta ndu, ma-ọbu ila ya n'iyì? 10Mb͕e Ọ lesiri ha nile anya gburugburu, O we si ya, Setipu aka-gi. O we me ya: ewe me ka aka-ya di ka ọ di na mbu. 11Ma ndi ahu juputara n'enweghi-uche; ha we nēkwurita n'etiti onwe-ha ihe ha gēme Jisus.
12O rue n'ubọchi ndia, na Ọ puru rigo n'ugwu ahu ikpe ekpere; O we nọgide n'ogologo abali ahu nile n'ikpe ekpere nye Chineke. 13Mb͕e chi bọrọ, Ọ kpọ ndi nēso uzọ-Ya biakute Ya: O we rọputa nime ha madu iri na abua, ndi Ọ kpọ-kwa-ra aha-ha ndi-ozi; 14Saimon, onye Ọ kpọ-kwa-ra aha-ya Pita, na Andru nwa-nne-ya, na Jemes na Jọn, na Filip na Batọlọmiu, 15na Matiu na Tomas, na Jemes nwa Alfiọs, na Saimon onye anākpọ Zilotis, 16na Judas nwa Jemes, na Judas Iskariot, onye ghọrọ onye rara ya nye; 17O we so ha rida, guzo n'ebe di lari, Ya na oké ìgwè ndi nēso uzọ-Ya, na oké ọtutu ndi- Ju ndi si na Judia nile na Jerusalem, na usọ oké osimiri nke Taia na Saidon, puta, ndi biara inu okwu-Ya, na ka ewe me ka aru-ha di ike n'ọria-ha nile; 18eme-kwa-ra ka aru-ha di ike, bú ndi mọ nādighi ọcha nēsob͕u. 19Ìgwè madu ahu nile we chọ imetu Ya aka: n'ihi na ike nēsi n'aru-Ya puta, nēme kwa ka aru di ha nile ike.
20Ya onwe-ya we welie anya-Ya elu le ndi nēso uzọ-Ya, si, Ngọzi nādiri unu, bú ndi-ob͕eye: n'ihi na ala-eze Chineke bu nke unu. 21Ngọzi nādiri unu ndi agu nāgu ub͕u a: n'ihi na afọ gēju unu. Ngọzi nādiri unu ndi nākwa ákwá ub͕u a: n'ihi na unu gāchì ọchì. 22Ngọzi nādiri unu, mb͕e ọ bula madu gākpọ unu asì, mb͕e ọ bula ha gēkewapu kwa unu, ta kwa unu uta, tufu kwa aha-unu dika ajọ ihe, n'ihi Nwa nke madu. 23Ṅurianu ọṅu n'ubọchi ahu, wuli-kwa-nu elu n'ihi ọṅù: n'ihi na le, ugwọ-ọ́lu-unu di uku n'elu-igwe: n'ihi na otú ahu ka ndi bu nna-ha mere ndi-amuma. 24Ma ahuhu gādiri unu ndi-ọgaranya: n'ihi na unu nēnwezu nkasi-obi-unu. 25Ahuhu gādiri unu, ndi afọ juworo ub͕u a: n'ihi na agu gāgu unu. Ahuhu gādiri unu, ndi nāchì ọchì ub͕u a: n'ihi na unu gēru újú kwa kwa ákwá. 26Ahuhu gādiri unu, mb͕e ọ bula madu nile gēkwu okwu ọma bayere unu: n'ihi na otú ahu ka ndi bu nna-ha mere ndi-amuma ugha.
27Ma asim unu ndi nānu okwum, Nāhunu ndi-iro-unu n'anya, nēmenu ihe ọma nye ndi nākpọ uṅu asì, 28nāgọzinu ndi nābu unu ọnu, nēkpe ekpere nye ndi nākpali unu. 29Onye ọ bula nke nēti gi aka n'otù ǹti, che-kwa-ra ya nke-ọzọ; onye nānapu kwa oké uwe-gi, eb͕ochila ya inara kwa uwe-ime-gi. 30Nēnye onye ọ bula nāriọ gi; onye nānapu gi ihe-gi, ariọkwala ha n'aka-ya ọzọ. 31Dika unu nāchọ kwa ka madu mere unu, unu onwe-unu nēme kwa ha otú ahu. 32Ọ buru kwa na unu ahú ndi ahu n'anya, bú ndi nāhu unu n'anya, àha ekele gini diri unu? n'ihi na ọbuná ndi-nmehie nāhu ndi ahu n'anya, bú ndi nāhu ha n'anya. 33Ọ buru kwa na unu eme ezi ihe nye ndi nēme ezi ihe nye unu, àha ekele gini diri unu? n'ihi na ọbuná ndi-nmehie nēme otù ihe ahu. 34Ọ buru kwa na unu ewere ihe binye ha, bú ndi unu nēle anya na unu gānata n'aka-ha, àha ekele gini diri unu? ọbuná ndi-nmehie nēwere ihe binye ndi-nmehie, ka ha we nara kwa nke ra ka ya. 35Ma nāhunu ndi-iro-unu n'anya, nēme-kwa-nu ezi ihe nye ha, nēbinye kwa ihe, ghara iwepu itukwasi-obi; ugwọ-ọlu-unu gādi kwa uku, unu gābu kwa umu nke Onye kachasi ihe nile elu: n'ihi na Ya onwe-ya nwere iru-ọma n'ebe ndi nēnweghi ekele na ndi bu ajọ madu nọ. 36Nwenu obi-ebere, dika Nna-unu nwere obi-ebere. 37Ọzọ, unu ekpela ikpé, agaghi-ekpe kwa unu ikpé ma-ọli: unu amakwala ikpé, agaghi-ama kwa unu ikpé ma-ọli: rapunu, agārapu kwa unu: 38nēnyenu, agēnye kwa unu; ọtùtù ọma, nke abiadaworo ala, yọkọta, nke nējubiga kwa ókè, ka ha gēnye n'obi-unu. N'ihi na ihe unu ji tù ihe ka agēji tùkwara unu ọzọ.
39O we tukwara ha ilu, si, Ònye-ìsì puru idu onye-ìsì? hà abua agaghi-adabà n'olùlù? 40Onye nēso uzọ onye-ozizí adighi-aka onye-ozizí-ya: ma onye ọ bula mb͕e emere ya ka o zue okè gādi ka onye-ozizí-ya. 41Ma gini mere i ji le irighiri ahihia nke di n'anya nwa-nna-gi, ma i tugharighi uche na ntuhie nke di n'anya nke gi? 42Ma-ọbu ì si aṅa pu isi nwa-nna-gi, Nwa-nnam, kwe ka m'tupu irighiri ahihia ahu nke di n'anya-gi, mb͕e gi onwe-gi nāhughi ntuhie nke di n'anya nke gi? Onye-iru-abua, buru uzọ tupu ntuhie ahu n'anya nke gi, mb͕e ahu ka i gēlegide anya itupu irighiri ahihia ahu nke di n'anya nwa-nna-gi. 43N'ihi na ọ dighi osisi ọma ọ bula nke nāmi nkpuru nābaghi n'ihe; ọzọ kwa, ọ dighi osisi ọ bula nābaghi n'ihe nke nāmi nkpuru ọma. 44N'ihi na amara osisi ọ bula site na nkpuru nke aka ya. N'ihi na madu adighi-ekpokọta mkpuru fig site n'ogwu, ha adighi-aghọta kwa nkpuru-vine site n'obi-ogwu. 45Ezi madu site n'ezi àkù nke obi-ya nēweputa ezi ihe; ajọ madu site kwa n'ajọ àkù nke obi-ya nēweputa ajọ ihe: n'ihi na ọnu-ya nēkwu okwu site n'ihe nke obi nwebigara ókè.
46Ma gini mere unu nākpọm, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, ma unu emeghi ihe nile M'kwuru? 47Onye ọ bula nke nābiakutem, nke nānu kwa okwum nile, nke nēme kwa ha, M'gēgosi unu onye o yiri: 48o yiri madu nke nēwu ulo, onye gwuru gwumi kwa, we tọ ntọ-ala n'elu oké nkume: mb͕e miri juru, osimiri we tikwasi ulo ahu, ma o nweghi ike ime ya ka ọ me nkpatu: n'ihi na ewuru ya nke-ọma. 49Ma onye nānu, ma o meghi ha, yiri madu nke nēwu ulo n'elu ala nēnweghi ntọ-ala; nke osimiri tikwasiri, ngwa ngwa o we dakasi; nbibi nke ulo ahu di kwa uku.

Currently Selected:

LUK 6: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy