YouVersion Logo
Search Icon

JỌN 10

10
1N'ezie, n'ezie, asim unu, Onye nēsiteghi n'ọnu-uzọ ba n'ogige aturu, kama o si n'ebe ọzọ nārigo ibà, onye ahu bu onye-ori na onye nāpunara madu ihe. 2Ma onye si n'ọnu-uzọ ba bu onye nāzù aturu. 3Onye ahu ka onye-ọnu-uzọ nēmeghere uzọ; aturu nānu kwa olu-ya: ọ nākpọ kwa aturu nke aka ya n'aha, n'edupu kwa ha. 4Mb͕e ọ bula ọ chupuru aturu nke aka ya nile, ọ nāga n'iru ha, aturu ahu nēso kwa ya: n'ihi na ha matara olu-ya. 5Ma ha agaghi-eso ọbìa ma-ọli, kama ha gāb͕anari ya: n'ihi na ha amataghi olu ndi-ọbìa. 6Ilu a ka Jisus turu ha: ma ha amaghi ihe ha bu, bú okwu Ọ nāgwa ha.
7Ya mere Jisus siri ha ọzọ, N'ezie, n'ezie, asim unu, Mu onwem bu ọnu-uzọ nke aturu. 8Ka ha ra, bú ndi nile burum uzọ bia, ha bu ndi-ori na ndi nāpunara madu ihe: ma aturu ahu anughi olu-ha. 9Mu onwem bu ọnu-uzọ ahu: ọ buru na onye ọ bula esi na Mu ba, agāzọputa ya, ọ ganābata kwa nāpu kwa, nāhu kwa nri ọ gāta. 10Onye-ori adighi-abia, ma-ọbughi ka o we zue ori, b͕u kwa, la kwa ihe n'iyì: Mu onwem biara ka ha we nwe ndu, ka ha nwebiga kwa ya ókè. 11Mu onwem bu onye-ọzùzù-aturu ọma: onye-ọzùzù-aturu ọma nātọb͕ọ ndu-ya n'ihi aturu-ya. 12Onye-ọlu egoro ego, nke nābughi kwa onye-ọzùzù-aturu, onye aturu nābughi nke aka ya, ọ nāhu agu ka ọ nābia, o we rapu aturu, b͕alaga, agu we nwude ha, chusa kwa ha: 13n'ihi na ọ bu onye-ọlu egoro ego, ọ kpọghi kwa aturu ahu ihe. 14Mu onwem bu onye-ọzùzù-aturu ọma; ama-kwa-ram aturu nkem, aturu nkem ma-kwa-ram, 15dika Nnam maram, dika Mu onwem ma-kwa-ra Nnam; anamatọb͕ọ kwa ndum n'ihi aturum. 16Aturu ọzọ ka M'nwe-kwa-ra, ndi nēsiteghi n'ogige-aturu nka: aghaghim iduta kwa ndi ahu, ha gānu kwa olum; otù ìgwè-aturu gādi kwa, otù Onye-ọzùzù-aturu. 17N'ihi nka ka Nnam nāhum n'anya, n'ihi na Mu onwem nātọb͕ọ ndum, ka M'we nara ya ọzọ. 18Ọ dighi onye ọ bula nānapum ya, kama Mu onwem nātọb͕ọ ya n'Onwem. Enwerem ike itọb͕ọ ya, enwe-kwa-ram ike inara ya ọzọ. Ihe a enyere n'iwu ka M'natara n'aka Nnam.
19Nkewa putara ọzọ n'etiti ndi-Ju n'ihi okwu ndia. 20Ọtutu nime ha we si, O nwere mọ ọjọ, anya adighi kwa Ya nma; gini mere unu nānu olu-Ya? 21Ndi ọzọ nāsi, Ndia abughi okwu onye mọ ọjọ ji. Mọ̀ ọjọ puru imeghe anya ndi kpuru ìsì?
22Ma ememe icheta owuwu ulo uku Chineke ọhu ruru na Jerusalem: ọ bu mb͕e oyi; 23Jisus we nējeghari n'ulo uku Chineke n'ìbà Solomon. 24Ya mere ndi-Ju nọgidere Ya buruburu, we si Ya, Ì nākwuba nkpuru-obi-ayi n'elu rue ole mb͕e? Ọ buru na Gi onwe-gi bu Kraist-ayi, gwawa ayi. 25Jisus zara ha, si, Agwaram unu, ma unu adighi-ekwe: ọlu nke Mu onwem nālu n'aha Nnam, ndia nāb͕aram àmà. 26Ma unu onwe-unu adighi-ekwe, n'ihi na unu adighi nime aturu nkem. 27Aturu nkem nānu olum, Mu onwem ma-kwa-ra ha, ha nēsokwam: 28Mu onwem nēnye kwa ha ndu ebighi-ebi; ha agaghi-ala kwa n'iyì ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi, ọ dighi kwa onye ọ bula gānapu ha n'akam. 29Nnam, Nke nyeworom ha, bu Onye uku kachasi ihe nile; ọ dighi kwa onye ọ bula puru inapu ihe n'aka Nnam. 30Mu onwem na Nnam bu otù. 31Ndi-Ju tuturu nkume ọzọ ka ha tua Ya. 32Jisus zara ha, si Ọtutu ọlu ọma ka M'gosiri unu site na Nnam; n'ìhi aha ọlu gini nime ndia Ka unu nātum nkume? 33Ndi-Ju zara Ya, si, Ọ bughi n'ihi ọlu ọma ka ayi nātu Gi nkume, kama ọ bu n'ihi nkwulu; n'ihi kwa na Gi onwe-gi, ebe I bu madu, I nēme Onwe-gi Chineke. 34Jisus zara ha, si, Èdeghi ya n'iwu-unu, si, Mu onwem siri, Chi ka unu bu? 35Ọ buru na Ọ kpọrọ ndi ahu chi, ndi okwu Chineke biaruru (apughi kwa imebi ihe edere n'akwukwọ nso), 36ùnu onwe-unu nēkwu okwu bayere Onye ahu Nnam doro nsọ zite kwa n'uwa, si, I nēkwulu Chineke; n'ihi na asim, Abum Ọkpara Chineke? 37Ọ buru na alughm ọlu Nnam, unu ekwelam. 38Ma ọ buru na aluam ha, ọbuná ma asi na unu ekweghi Mu onwem, nēkwerenu ọlum: ka unu we mara nāmagide kwa na Nnam di nimem, na Mu onwem di kwa nime Nnam. 39Ha we chọ kwa uzọ ijide Ya: O we pua n'aka-ha.
40O we je ọzọ gabiga n'ofè Jọdan rue ebe Jọn nēme baptism na mbu; O we n-ogide n'ebe ahu. 41Ọtutu madu we biakute Ya; ha nāsi kwa, N'ezie ọ dighi ihe-iriba-ama Jọn mere: ma ka ha ra, bú ihe Jọn kwuru bayere Onye a, bu ezi-okwu 42Ọtutu madu we kwere na Ya n'ebe ahu.

Currently Selected:

JỌN 10: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy