YouVersion Logo
Search Icon

MATIU 1

1
1Akwukwọ osuso-ọmumu Jisus Kraist, Nwa Devid, nwa Abraham.
2Abraham muru Aisak; Aisak we mua Jekob; Jekob we mua Juda na umu-nna-ya; 3Juda we mua Perez na Zera site na Tema; Perez we mua Hezron; Hezron we mua Ram; 4Ram we mua Aminadab; Aminadab we mua Nahshon; Nahshon we mua Salmon; 5Salmon we mua Boaz site na Rehab; Boaz we mua Obed site na Rut; Obed we mua Jesi; 6Jesi we mua Devid, bú eze.
Devid we mua Solomon site na nwunye nke Uraia; 7Solomon we mua Rehoboam; Rehoboam we mua Abaija; Abaija we mua Esa; 8Esa we mua Jehoshafat; Jehoshafat we mua Joram; Joram we mua Uzaia; 9Uzaia we mua Jotam; Jotam we mua Ehaz; Ehaz we mua Hezekaia; 10Hezekaia we mua Manase; Manase we mua Emon; Emon we mua Josaia; 11Josaia we mua Jekonaia na umu-nne-ya, na mb͕e emere ka ha je biri na Babilon.
12Mb͕e emesiri ka ha je biri na Babilon, Jekonaia we mua Shealtiel; Shealtiel we mua Zerubabel; 13Zerubabel we mua Abaiud; Abaiud we mua Elaiakim; Elaiakim we mua Ezoa; 14Ezoa we mua Sedok; Sedok we mua Akim; Akim we mua Elaiud; 15Elaiud we mua Eleeza; Eleeza we mua Matan; Matan we mua Jekob; 16Jekob we mua Josef di Meri, nwanyi nke muru Jisus, Onye anākpọ Kraist.
17Ya mere ọb͕ọ nile site n'Abraham rue Devid di ọb͕ọ iri na anọ; site na Devid rue mb͕e emere ka ha je biri na Babilon di kwa ọb͕ọ iri na anọ; site na mb͕e emere ka ha je biri na Babilon rue Kraist di kwa ọb͕ọ iri na anọ.
18Ma ọmumu Jisus Kraist di otú a: Mb͕e ekwereri na Josef gālu nne-Ya Meri, mb͕e ha akēdinakọtaghi, ahuru na ọ di ime site na Mọ Nsọ. 19Ma Josef di-ya, ebe ọ bu onye ezi omume, ma ọ chọghi igosi ya n'iru ọra, o zubere irapu ya na nzuzo. 20Ma mb͕e ihe ndia di ya n'obi, le, mọ-ozi nke Chineke were onwe-ya gosi ya na nrọ, si, Josef, nwa Devid, atula egwu ikuru nwunye-gi Meri: n'ihi na Ihe Nke ọ di ime Ya sitere n'aka Mọ Nsọ. 21Ọ gāmuputa kwa Nwa-nwoke; i gākpọ kwa aha-Ya Jisus, n'ihi na Ya onwe-ya gāzọputa ndi nke Ya na nmehie nile ha. 22Ma ihe a dum emewo, ka okwu Onye-nwe-ayi kwuru site n'ọnu onye-amuma-Ya we mezu, si,
23Le, nwa-ab͕ọghọ ahu nāmaghi nwoke gādi ime, ọ gāmuta kwa Nwa-nwoke,
Ha gākpọ kwa aha-Ya Immanuel;
nke bu, ma asugharia ya, Chineke nọyere ayi. 24Josef we si n'ura-ya bilie, me dika mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi nyere ya iwu, we kuru nwunye-ya; 25ọ maghi kwa ya rue mb͕e ọ muputara Nwa-nwoke: o we kpọ aha-Ya Jisus.

Currently Selected:

MATIU 1: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy