YouVersion Logo
Search Icon

JỌN 11

11
1Ma aru otù nwoke adighi ike, bú Lazarọs onye Betani, onye sitere n'obodo ntà Meri na Mata nwa-nne-ya nwanyi. 2Ma ọ bu Meri ahu nke were manu-otite te Onye-nwe-ayi, were kwa agiri-isi-ya hicha ukwu-Ya abua, onye aru nwa-nne-ya nwoke, bú Lazarọs, nādighi ike. 3Ya mere umu-nne-ya nwanyi zigara Ya, si, Onye-nwe-ayi, le, aru nke onye ahu I huru n'anya adighi ike. 4Ma mb͕e Jisus nuru ya, Ọ si, Nriaria nka abughi nke ọnwu, kama ọ bu n'ihi otuto Chineke, ka ewe nye Ọkpara Chineke otuto site na ya. 5Ma Jisus huru Mata, na nwa-nne-ya nwanyi, na Lazarọs, n'anya. 6Ya mere mb͕e Ọ nuru na aru-ya adighi ike, mb͕e ahu Ọ nọgidere ubọchi abua n'ebe Ọ nọ. 7Mb͕e ahu mb͕e nka gasiri Ọ si ndi nēso uzọ-Ya, Ka ayi je Judia ọzọ. 8Ndi nēso uzọ-Ya si Ya, Rabai, ub͕u a ka ndi-Ju nāchọ uzọ itu Gi nkume; Ì nēje kwa ebe ahu ọzọ? 9Jisus zara, si, Ọ̀ bughi oge hour iri na abua di n'ehihie? Ọ buru na onye ọ bula ejeghari n'ehihie, ọ dighi-asu ngọngọ, n'ihi na ọ nāhu ìhè nke uwa nka. 10Ma ọ buru na onye ọ bula ejeghari n'abali, ọ nāsu ngọngọ, n'ihi na ìhè adighi nime ya. 11Ihe ndia ka O kwuru: mb͕e nka gasiri Ọ si ha, Enyi-ayi Lazarọs adawo n'ura; ma anamaga, ka M'we kpọte ya n'ura. 12Ya mere ndi nēso uzọ-Ya siri Ya, Onye-nwe-ayi, ọ buru na ọ dawo n'ura, agāzọputa ya. 13Ma Jisus kwururi okwu bayere ọnwu-ya: ma ndi ahu chère na Ọ nēkwu okwu bayere ida n'ura efu. 14Ya mere Jisus gwawara ha okwu mb͕e ahu, si, Lazarọs nwuru anwu. 15Anamaṅuri kwa ọṅu n'ihi unu na adighi m n'ebe ahu, ka unu we kwere; otú ọ di, ka ayi jekuru ya. 16Ya mere Tomas, onye anākpọ Didimọs, siri ibe-ya ndi nēso Jisus, Ka ayi onwe-ayi je kwa, ka ayi we so Ya nwua.
17Ya mere mb͕e Jisus biara, Ọ huru na ọ diwori n'ílì ubọchi anọ a. 18Ma Betani di Jerusalem nso, ihe dika furlong iri na ise n'idi-anya; 19ma ọtutu n'etiti ndi-Ju biakutereri Mata na Meri, ka ha we kasie ha obi n'ihi nwa-nne-ha. 20Ya mere mb͕e Mata nuru na Jisus nābia, o je zute Ya: ma Meri nānọdu n'ulo. 21Ya mere Mata siri Jisus, Onye-nwe-ayi, ọ buru na I nọri n'ebe a, nwa-nnem nwoke agaghi-anwuwori. 22Ma ọbuná ub͕u a amataram na, ka ihe I gāriọ n'aka Chineke ra, Chineke gēnye Gi. 23Jisus si ya, Nwa-nne-gi nwoke gēsi n'ọnwu bilie. 24Mata si Ya, Amataram na o gēsi n'ọnwu bilie na nbilite-n'ọnwu n'ubọchi ikpe-azu. 25Jisus siri ya, Mu onwem bu nbilite-n'ọnwu na ndu: onye nēkwere na Mu, ọbuná ma asi na ọ nwuru anwu, ọ gādi ndu ọzọ: 26ọzọ, onye ọ bula nke nādi ndu, nke nēkwere kwa na Mu, ọ gaghi-anwu ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi. I kwere nka? 27Ọ si Ya, E, Onye-nwe-ayi: Mu onwem ekwerewo na Gi onwe-gi bu Kraist-ayi, Ọkpara Chineke, Onye nābia n'uwa. 28Mb͕e o kwusiri nka, o we je kpọ Meri nwa-nne-ya nwanyi na nzuzo, si, Onye-ozizí nọ n'ebe a, Ọ nāekpọ kwa gi. 29Ma nwanyi ahu, mbe ọ nuru ya, o bilie ọsọsọ, we biakute Ya. 30(Ma Jisus akābiarughi nime obodo ntà ahu, kama Ọ nānọ n'ebe Mata zutere Ya.) 31Ya mere ndi-Ju ndi ha na ya di n'ulo, ndi nākasi kwa ya obi, mb͕e ha huru Meri, na o biliri ọsọsọ we pua, ha soro ya, nēchè na ọ nējeru ílì ka o we kwa ákwá n'ebe ahu. 32Ya mere Meri, mb͕e ọ biara n'ebe Jisus nọ, mb͕e ọ huru Ya, ọ da n'ala n'ukwu-Ya, nāsi Ya, Onye-nwe-ayi, ọ buru na I nọri n'ebe a, nwa-nnem nwoke agaghi-anwuwori. 33Ya mere mb͕e Jisus huru ya ka ọ nākwa ákwá, na ndi-Ju ndi soro ya bia ka ha nākwa kwa ákwá, Ọ su udè nime mọ-Ya, me kwa ka obi lọ Ya miri, 34O we si, Òle ebe unu tọb͕ọworo ya? Ha si Ya, Onye-nwe-ayi, Bia, le kwa. 35Anya-miri puru n'anya Jisus. 36Ya mere ndi-Ju nāsi, Le otú Ọ huru ya n'anya! 37Ma ufọdu nime ha siri, Onye a, Nke meghere anya onye ahu kpuru ìsì, Ọ̀ pughi ime kwa ka nwoke a ghara inwu anwu? 38Ya mere Jisus nābiaru ílì ahu nāsu udè ọzọ nime Onwe-ya. Ma ọ bu ọb͕à, otù nkume nātọb͕ọ kwa n'ọnu-ya. 39Jisus si, Wepunu nkume ahu. Mata, nwa-nne-nwanyi nke onye ahu nwuruwori, si Ya, Onye-nwe-ayi, ọ nēsì ísì ub͕u a: n'ihi na nka mere ya ubọchi anọ ọ nwuru. 40Jisus si ya, Àsighi m i na, ọ buru na i kwere, i gāhu ebube Chineke? 41Ya mere ha wepuru nkume ahu. Ma Jisus weliri anya-Ya elu, si, Nna, ekelem I na I nuru olum. 42Ma Mu onwem matara na I nānu olum mb͕e nile: ma n'ihi ìgwè madu a nke guzoro gburugburu ka M'kwuru ya, ka ha we kwere na ọ bu Gi onwe-gi ziterem. 43Ma mb͕e O kwusiri ihe ndia, O were oké olu tie nkpu, si, Lazarọs, puta n'èzí. 44Onye nwururi anwu putara, ewerewori ákwà-ozu ke ya ukwu na aka; were kwa ichafọ kechie ya iru. Jisus si ha, Tọpunu ya, ghara kwa ya ka ọ la.
45Ya mere ọtutu n'etiti ndi-Ju, ndi biakutere Meri, ndi le-kwa-ra ihe O mere, ha kwere na Ya. 46Ma ufọdu n'etiti ha jekuru ndi-Farisi, kọrọ ha ihe Jisus mere.
47Ya mere ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi kpọrọ nnọkọ-ikpé ka ha zukọ, si, Gini ka ayi nēme? n'ihi na Nwoke a nēme ọtutu ihe-iriba-ama. 48Ọ buru na ayi arapu Ya otú a, madu nile gēkwere na Ya: ndi Rom gābia kwa napu ebe nke ayi na mba nke ayi. 49Ma otù onye n'etiti ha, bú Kaiafas, ebe ọ bu onye-isi-nchu-àjà n'arọ ahu, si ha, Unu onwe-unu amataghi ihe ọ bula, 50unu atuleghi kwa uche na ọ bara unu urù ka otù onye nwua n'ọnọdu ndi-Ju, ka mba-ayi dum ghara ila kwa n'iyì. 51Ma o kwughi nka site n'onwe-ya: kama ebe ọ bu onye-isi-nchu-àjà n'arọ ahu, o buru amuma na Jisus gaje inwu anwu n'ọnọdu mba ahu; 52ọ bughi kwa nání n'ọnọdu mba ahu, kama ka O we me kwa ka umu Chineke ndi b͕asaworo zukọ n'otù. 53Ya mere site n'ubọchi ahu ha b͕ara ìzù ka ha we b͕ue Ya.
54Ya mere Jisus adighi-ejeghari n'iru ọra madu n'etiti ndi-Ju ọzọ, kama O si n'ebe ahu je ba n'ala nke di ọhia nso, ba n'obodo anākpọ Ifraim; O we nọgide n'ebe ahu, Ya na ndi nēso uzọ-Ya. 55Ma ememe ngabiga nke ndi-Ju di nso: ọtutu madu we si n'ala ndi-Ju rigoro Jerusalem mb͕e ememe ngabiga ahu akērughi, ime onwe-ha ka ha di ọcha. 56Ya mere ha nāchọ Jisus, we nēkwurita n'etiti onwe-ha, mb͕e ha guzoro n'ulo uku Chineke, si, Gini ka unu nēchè? Nà Ọ gaghi-abia n'ememe a ma-ọli? 57Ma ndi-isi-nchu-àjà na ndi-Farisi nyereri iwu ka, ọ buru na onye ọ bula mara ebe Ọ nọ, ka o gosi ya, ha we jide Ya.

Currently Selected:

JỌN 11: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy