YouVersion Logo
Search Icon

JENESIS 23

23
1Ndu Sera we buru ọgu arọ isi na asa: ndia bu arọ ndu Sera. 2Sera we nwua na Kiriat-aba (nke ahu bu Hebron), n'ala Kenean: Abraham we bia itiri Sera aka n'obi, na ikwara ya ákwá. 3Abraham we si n'iru onye nke ya nwuru anwu bilie, gwa umu Het okwu, si, 4Ọbìa na onye-nnọdu ka m'bu n'etiti unu: nyenum ihe-onwunwe, bú ala-ílì, n'etiti unu, ka m'we lìpu ya n'anyam, bú onye-nkem nwuru anwu. 5Umu Het we za Abraham, si ya, 6Nuru olu-ayi, onye-nwem: onye-isi nke Chineke ka i bu n'etiti ayi: lìe onye-nke-gi nwuru anwu n'ílì ahu nke kachasi nma n'ílì-ayi nile; ọ dighi onye nime ayi gēb͕ochiri gi ílì-ya ka i ghara ilì onye-nke-gi nwuru anwu 7Abraham we bilie, kpọ isi ala nye ndi ala ahu, bú umu Het. 8Ọ we kpayere ha uka, si, Ọ buru na ọ di na nkpuru-obi-unu ilìpu ya n'anyam, bú onye-nkem nwuru anwu, nurunu olum, riọkwara m Efron nwa Zoha, 9ka ọ we nyem ọb͕à Makpila, nke ọ nwere, nke di n'isi nke ọhia-ya n'ego zuru ezu o ruru ka ọ gēnyem ya n'etiti unu ka ọ buru ihe-onwunwe, nke gābu ala-ílì. 10Ma Efron nānọdu n'etiti umu Het: Efron onye Het we za Abraham na nti umu Het, bú ndi nile nābà n'ọnu-uzọ-ama obodo-ya, si, 11E-è, onye-nwem, nuru olum: ọhia ahu ka m'nyeworo gi, na ọb͕à ahu nke di nime ya, gi ka m'nye-woro ya; n'anya umu ndi nkem ka m'nyeworo gi ya: lìe onye-nke-gi nwuru anwu. 12Abraham we kpọ isi ala n'iru ndi ala ahu. 13Ọ gwa Efron okwu na nti ndi ala ahu, si, Kama, ọ buru na gi onwe-gi kwere, biko, nuru olum: enyewom ego ọhia ahu; naram ya, ka m'we lìe onye-nkem nwuru anwu n'ebe ahu. 14Efron we za Abraham, si ya, 15Onye-nwem, nuru olum: ala nke ruru nnù shekel ọla-ọcha, ǹke ahu bu gini n'etiti mu na gi? lì kwa onye-nke-gi nwuru anwu. 16Abraham we ge Efron nti; Abraham we tùara Efron ọla-ọcha ahu, nke o kwuru na nti umu Het, nnù shekel ọla-ọcha nke ndi-ahia gānara. 17Ọhia Efron, nke di nime Makpila, nke di n'iru Mamre, ọhia ahu, na ọb͕à ahu nke di nime ya, na osisi nile nke di n'ọhia ahu, nke di n'ókè-ala ya nile gburugburu, ewe me ha ka ha guzosiere Abraham ike 18ibu ihe-nzuta n'anya umu Het, n'etiti ndi nile nābà n'ọnu-uzọ-ama obodo-ya. 19Emesia Abraham lìri Sera, bú nwunye-ya, n'ọb͕à ọhia Makpila ahu n'iru Mamre (nke ahu bu Hebron), n'ala Kenean. 20Umu Het we me ọhia ahu na ọb͕à nke di nime ya ka ha guzosiere Abraham ike ibu ihe-onwunwe nke gābu ala-ílì.

Currently Selected:

JENESIS 23: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy