YouVersion Logo
Search Icon

JENESIS 22

22
1O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na Chineke nwara Abraham, si ya, Abraham; ọ si, Lekwam. 2Ọ si, Biko, were nwa-gi nwoke nke i nwere nání ya, onye i huru n'anya, bú Aisak, je ala Moraia; sure ya n'ebe ahu, ka ọ buru àjà-nsure-ọku, n'elu otù nime ugwu ahu nke M'gāsi gi je. 3Abraham we bilie n'isi-ututu, jikwa inyinya-ibu-ya, chiri madu abua nime umu-okorọbia-ya tiyere onwe-ya, na Aisak, bú nwa-ya nwoke; ọ kpọwa nkú nke àjà-nsure-ọku, bilie, je ebe ahu nke Chineke siri ya-ri je. 4N'ubọchi nke-atọ Abraham weliri anya-ya abua, hu ebe ahu n'ebe di anya. 5Abraham we si umu-okorọbia-ya, Nọdunu ebe a n'onwe-unu, unu na inyinya-ibu, ma mu onwem na nwa-okoro a gēje ebe ahu; ayi gākpọ kwa isi ala, chigharikute unu. 6Abraham we were nkú àjà-nsure-ọku, bo Aisak nwa-ya nwoke; o jide n'aka-ya ọku na mma; ha abua we yikọ je. 7Aisak we gwa Abraham, bú nna-ya, okwu, si, Nnam; ọ si, Lekwam, nwam. Ọ si, Le, ọku na nkú: ma òle ebe nwa-aturu iji chu aja-nsure-ọku di? 8Abraham we si, Chineke gāhuru Onwe-ya nwa-aturu iji chu aja-nsure-ọku, nwam: ha abua we yikọ je. 9Ha biarue ebe ahu nke Chineke siri ya-ri je; Abraham we wue ebe-ichu-aja n'ebe ahu, do nkú ahu n'usoro, ke Aisak, bú nwa-ya nwoke, ab͕ú, tukwasi ya n'elu ebe-ichu-àjà, n'elu nku. 10Abraham we setia aka-ya, were mma ahu ib͕u nwa-ya nwoke. 11Ma mọ-ozi nke Jehova siri n'elu-igwe kpọ ya òkù, si, Abraham, Abraham: ọ si, Lekwam. 12Ọ si, Esetila aka-gi tukwasi n'aru nwa-okoro ahu, eme-kwa-la ya ihe ọ bula: n'ihi na ub͕u a ka M'mara na onye nātu egwu Chineke ka i bu, n'ihi na i b͕ochighi nwa-gi nwoke, nke i nwere nání ya, iwere ya nyem. 13Abraham we welie anya-ya abua hu, ma, le, otù ebulu n'azu ya, nke alughi-ulù nējide ya na mpi-ya: Abraham we je, were ebulu ahu, sure ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku n'ọnọdu nwa-ya nwoke. 14Abraham we kpọ aha ebe ahu Jehova-Jaire: dika anāsi rue taa, N'ugwu nke Jehova ka agāhu ya. 15Mọ-ozi nke Jehova we si n'elu-igwe kpọ Abraham òkù nke ub͕ò abua, 16si, Ejim Onwem ṅu iyi, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, na n'ihi na i mewo ihe a, n'ihi na i b͕ochighi kwa nwa-gi nwoke, onye i nwere nání ya: 17na n'igọzi M'gāgọzi gi, n'ime ka aba uba M'gēme kwa ka nkpuru-gi ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, na dika ájá nke di n'usọ oké osimiri; nkpuru-gi gēnweta kwa ọnu-uzọ-ama nke ndiroya; 18ọ bu kwa na nkpuru-gi ka mba nile nke uwa gāgọzi onwe-ha; n'ihi na i gewo nti n'olum. 19Abraham we chigharikute umu-okorọbia-ya, ha bilie, yikọ je Bia-sheba; Abraham we biri na Bia-sheba. 20O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na egosiri Abraham, si, Le, Milka, ya onwe-ya amuwo-kwa-ra nwa-nne-gi nwoke, bú Nehoa, umu-ndikom; 21Uz, bú ọkpara-ya, na Buz, bú nwa-nne-ya, na Kemuel, bú nna Eram 22na Kesed, na Hazo, na Pildash, na Jidlaf, na Betuel. 23Betuel we mua Rebeka: madu asatọ ndia ka Milka muru nye Nehoa, bú nwa-nne Abraham. 24Iko-ya nwayi, onye aha-ya bu Reuma, ya onwe-ya mu-kwa-ra Tiba, na Gaham, na Tahash, na Meaka.

Currently Selected:

JENESIS 22: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy